Nkpugh

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22


Isi 20

M'we hu mọ-ozi ka o nēsi n'elu-igwe ridata, nēji nkpisi-ugodi nke abyss ahu n'aka-ya, ya na oké nkpọrọ.
2 O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri,
3 we tubà ya nime abyss ahu, mechie ya, kà kwa ya akàrà n'elu ya, ka o we ghara iduhie mba nile ọzọ, rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi: mb͕e arọ ndia gasiri aghaghi itọpu ya nwa oge.
4 M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.
5 Ndi fọduru n'etiti ndi nwuru anwu adighi ndu rue mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi. Nka bu nbilite-n'ọnwu mbu.
6 Ngọzi nādiri ya, ọ di kwa nsọ, bú onye nwere òkè nime nbilite-n'ọnwu mbu ahu: ọnwu nke-abua ahu enweghi ike n'ebe ndia nọ; kama ha gābu ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Kraist, ha gēso kwa Ya buru eze nnù arọ abua na ọgu iri ahu.
7 Ma mb͕e nnù arọ abua na ọgu iri ahu gāgwusi, agātọpu Setan n'ulo-nkpọrọ-ya,
8 ọ gāputa kwa iduhie mba nile ndi di na nkuku anọ nke uwa, bú Gog na Megog, ime ka ha zukọ ibu agha ahu: ndi ọnu-ọgugu-ha ra ka ájá nke oké osimiri.
9 Ha we rigo n'obodobo uwa, nọgide ọmuma-ulo-ikwū ndi nsọ gburugburu, ya na obodo ahu nke ahuworo n'anya: ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ha.
10 Ekwensu ahu nke nēduhie ha, atubàra ya nime ọdọ ọku na brimstone, ebe anu-ọhia ahu na onye-amuma ugha ahu nọ kwa; agēmekpa kwa ha aru ehihie na abali rue mb͕e nile ebighi-ebi.
11 M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.
12 M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n'iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n'ihe nile edereri n'akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di.
13 Oké osimiri we nyeghachi ndi nwuru anwu di nime ya; ọnwu na Hedis nyeghachi-kwa-ra ndi nwuru anwu di nime ha: ewe kpe ha ikpé n'otù n'otù dika ọlu nile ha si di.
14 Ewe tubà ọnwu na Hedis nime ọdọ ọku ahu. Nka bu ọnwu nke-abua ahu, bú ọdọ ọku ahu.
15 Ọ buru kwa na ahughi onye ọ bula ka edereri aha-ya n'akwukwọ nke ndu ahu, ewe tubà ya n'ọdọ ọku ahu.