Nkpugh

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22


Isi 17

Otù mọ-ozi n'etiti ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu we bia, we kpayerem uka, si, Biari, m'gēgosi gi ikpé nke oké nwanyi ahu nākwa iko onye nānọkwasi n'ọtutu miri;
2 onye ya na ndi-eze uwa kwara iko, eme-kwa-ra ka manya ikwa-iko-ya bà ndi bi n'uwa n'anya.
3 O we bupum ba n'ọhia nime Mọ Nsọ: m'we hu nwanyi ka ọ nānọkwasi n'anu-ọhia nācha uhie uhie, nke nwere aha di iche iche juputara na nkwulu Chineke, nwe kwa isi asa na mpi iri.
4 Eb͕okwasiwo kwa nwanyi ahu ákwà ododo na ákwà uhie, ewerewo kwa ọla-edo na nkume di oké ọnu na pearl chọ ya nma, o nwe-kwa-ra ìko ọla-edo n'aka-ya nke juputara n'ihe-árú, bú ihe nile nādighi ọcha nke ikwa-iko-ya,
5 edekwasi-kwa-rari aha n'egedege-iru-ya, bú IHE-OMIMI, BABILON UKU AHU, NNE NKE NDI NÁKWA IKO NA NKE IHE-ÁRÚ NILE NKE UWA.
6 M'we hu nwanyi ahu ka ọbara ndi nsọ na ọbara ndi-àmà Jisus nābà ya n'anya dika manya. Mb͕e m'huru ya o we jum anya nke-uku.
7 Mọ-ozi ahu we sim, N'ìhi gini ka o juru gi anya? mu onwem gāgwa gi ihe-omimi nke nwanyi ahu, na nke anu-ọhia ahu nke nēburu ya, nke nwere isi asa ahu na mpi iri ahu.
8 Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n'abyss ahu rigoputa, na ila n'iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n'elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n'akwukwọ nke ndu ahu site n'oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa.
9 N'ebe a ka uche nke nwere amam-ihe di. Isi asa ahu bu ugwu asa, nke nwanyi ahu nānọdu n'elu ha:
10 ndi-eze asa di kwa; ise nime ha adawo, otù nime ha nādi adi, onye fọduru akābiaghi; mb͕e ọ gābia ọ ghaghi kwa inọgide nwa oge.
11 Anu-ọhia ahu nke diri, nke nādighi kwa ub͕u a, ya onwe-ya bu kwa nke-asatọ, o si kwa n'asa ahu puta; ọ nāla kwa n'iyì.
12 Mpi iri ahu nke i hu-kwa-ra bu eze iri, madu ndi akānataghi ala-eze ọ bula; ma ha nānata ike dika ndi-eze, ha na anu-ọhia ahu, otù oge hour.
13 Ndia nwere otù ọlū, ha nēwere kwa ike-ha na ichi-isi-ha nye anu-ọhia ahu.
14 Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.
15 O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.
16 Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku.
17 N'ihi na Chineke tiyere n'obi-ha ime ìzù-Ya, na ib͕ata otù ìzù, na iwere ala-eze-ha nye anu-ọhia ahu, rue mb͕e agēmezu okwu nile nke Chineke.
18 Ma nwanyi ahu i huru bu obodo uku ahu, nke nwere ala-eze nāchi ndi-eze uwa.