II. Ndi Kọrint

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13


Isi 3

Àyi nāmalite ọzọ ime ka madu mara ayi? ma-ọbu ǹkpà akwukwọ-ozi ime ka madu mara ayi nākpa ayi inye unu ma-ọbu inara unu, dika ọ nākpa ufọdu?
2 Unu onwe-unu bu akwukwọ-ozi-ayi, nke edeworo nime obi-ayi, nke madu nile mara nāgu kwa;
3 ebe emere ka unu puta ìhè na unu bu akwukwọ-ozi Kraist, nke ayi jere ozi ya, nke anējighi ink de, kama ọ bu Mọ nke Chineke di ndu ka eji de ya; ọ bughi n'elu mbadamba nkume, kama ọ bu n'elu mbadamba ihe di iche, bú obi nke anu-aru.
4 Ntukwasi-obi di otú a ka ayi nwe-kwa-ra site n'aka Kraist n'ebe Chineke nọ:
5 ọ bughi na ayi ruru n'onwe-ayi, igu ihe ọ bula dika o sitere n'onwe-ayi; kama iru-eru-ayi sitere na Chineke;
6 Onye me-kwa-ra ayi ka ayi rue ibu ndi nēje ozi ọb͕ub͕a-ndu ọhu; ọ bughi nke ihe edeworo n'akwukwọ, kama ọ bu nke Mọ Nsọ: n'ihi na ihe ahu edeworo n'akwukwọ nēb͕u eb͕u, ma Mọ ahu nēnye ndu.
7 Ma ọ buru na ije-ozi nke ọnwu, nke edeworo n'akwukwọ, nke atuworo n'elu nkume, biara n'ebube, nke mere umu Israel apughi ilegide iru Moses anya n'ihi ebube nke iru-ya; ebube nke anēme ka ọ ghara idi irè:
8 ìje-ozi nke Mọ Nsọ gēsi aṅa ghara idi kari n'ebube?
9 N'ihi na asi na ije-ozi nke ọmuma-ikpé bu ebube, ije-ozi nke ezi omume gēnwebiga ebube ókè kari nke-uku.
10 N'ihi na ihe emeworo ka ọ di ebube, emeghi ya ka ọ di ebube n'akuku a n'ezie, n'ihi ebube ahu nke kariri nke-uku.
11 N'ihi na asi na ihe anēme ka ọ ghara idi irè ji ebube bia, ihe nādigide dikariri n'ebube nke-uku.
12 Ya mere ebe ayi nwere olile-anya di otú a, ayi nēkwuwa okwu nke-uku,
13 ayi adighi kwa ka Moses, onye nēkpudo ihe-nkpudo n'iru-ya, ka umu Israel we ghara ilegide anya rue ọgwugwu ihe ahu anēme ka ọ ghara idi irè:
14 ma emere ka uche-ha ma etili: n'ihi na rue ubọchi ta n'ọgugu ọb͕ub͕a-ndu ochie otù ihe-nkpudo ahu nādigide, ebe anēkpugheghi na anēme ya ka ọ ghara idi irè nime Kraist.
15 Ma rue ubọchi ta, mb͕e ọ bula anāgu akwukwọ Moses, ihe-nkpudo nādigide n'obi-ha.
16 Ma mb͕e ọ bula o gēchigharikute Onye-nwe-ayi, ewepu ihe-nkpudo ahu.
17 Ma Onye-nwe-ayi bu Mọ ahu: ma ebe Mọ nke Onye-nwe-ayi nọ, n'ebe ahu ka madu nwere onwe-ha.
18 Ma ayi onwe-ayi nile ebe ayi were iru nke ekpupuworo ihe-nkpudo nēgosi ebube nke Onye-nwe-ayi dika enyo, anēnwogha ayi rue n'otù onyinyo ahu site n'ebube rue ebube, ọbuná dika anēnye ya site n'Onye-nwe-ayi, bú Mọ Nsọ.