II. Ndi Kọrint

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13


Isi 13

Nka bu ub͕ò nke-atọ m'nābiakute unu. N'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo.
2 Agwawom ha n'oge gara aga, anamebu kwa uzọ gwa ha, bú ndi mehieworo n'oge gara aga, na ndi nile fọduru, dika mb͕e m'nọ n'etiti unu ub͕ò nke-abua, ub͕u a kwa, mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, si, na, ọ buru na abiam ọzọ, m'gaghi-eme ebere;
3 ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n'ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu:
4 n'ihi na esitere n'adighi-ike kpọgide Ya n'obe, ma O sitere n'ike Chineke nādi ndu. N'ihi na ayi onwe-ayi bu kwa ndi nādighi ike nime Ya, ma ayi gēsite n'ike Chineke n'ebe unu nọ so Ya di ndu.
5 Nānwanu onwe-unu, ma unu di n'okwukwe-ayi; nānwaputanu onwe-unu. Ma-ọbu ùnu amazughi onwe-unu, na Jisus Kraist nọ nime unu? ma-ọbughi na ọ bu ezie na unu bu ndi ajuru aju.
6 Ma anamele anya na unu gāmara na ayi onwe-ayi abughi ndi ajuru aju.
7 Ma ayi nēkpere Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọ ọ bula; ọ bughi ka ayi onwe-ayi we puta ìhè, na ayi bu ndi anwaputara, kama ka unu onwe-unu we nēme ihe ọma, ka ayi onwe-ayi we di kwa ka ndi ajuru aju.
8 N'ihi na ayi apughi ime ihe ọ bula megide ezi-okwu, kama ayi nēmere ezi-okwu ihe nile.
9 N'ihi na ayi nāṅuri ọṅu, mb͕e ọ bula ayi onwe-ayi nādighi ike, ma unu onwe-unu di ike: nka ka ayi nēkpe-kwa-ra Chineke, bú ka eme ka unu zu okè.
10 N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.
11 Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.
12 Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.
13 Ndi nsọ nēkele unu.
14 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.