I. Ndi Kọrint

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16


Isi 5

Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n'etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n'etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n'etiti unu nwere nwunye nna-ya.
2 Unu onwe-unu afuliwo kwa onwe-unu elu, unu erughi kwa újú kama nke ahu, ka ewe wepu onye ahu n'etiti unu, bú onye luru ọlu a.
3 N'ihi na mu onwem n'ezie, ebe m'nānọghi n'etiti unu n'arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, ekpewom onye ahu nke lutara nka otú a ikpé ọbuná ub͕u a, dika agāsi na anọm,
4 n'aha nke Onye-nwe-ayi Jisus, mb͕e unu zukọrọ, mọm nēso kwa unu, ya na ike nke Onye-nwe-ayi Jisus,
5 irara onye di otú a nye n'aka Setan ibibi anu-aru-ya, ka ewe zọputa mọ-ya n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus.
6 Ihe-inya-isi-unu adighi nma. Ùnu amataghi na ihe-iko-achicha di ntà nēko ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ dum?
7 Sachapunu ihe-iko-achicha ochie, ka unu we buru ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ ọhu, dika unu bu achicha ekoghi-eko. N'ihi na achu-kwa-ra àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist:
8 ya mere, ka ayi nēme ememe ahu, ọ bughi n'ihe-iko-achicha ochie, ọ bughi kwa n'ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ ọlu, kama n'achicha ekoghi-eko nke bu idi-ọcha na ezi-okwu.
9 Edegaram unu n'akwukwọ-ozim ka unu na ndi nākwa iko ghara imekọ ihe;
10 ọ bughi ndi nke uwa nka ndi nākwa iko ma-ọli, ma-ọbu ndi-anya-uku-ya na ndi nāpunara madu ihe, ma-ọbu ndi nēkpere arusi: ebe ọ gādi unu nkpà isi n'uwa pua ma asi na unu eme otú a:
11 ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe.
12 N'ihi na òle ihe bu nkem ikpe ndi nọ n'èzí ikpé? Ọ̀ bughi ndi nọ n'ime ka unu onwe-unu nēkpe?
13 ma Chineke nēkpe ndi nọ n'èzí ikpé. Wepunu ajọ onye ahu n'etiti onwe-unu.