I. Ndi Kọrint
Isi 16
Ma okwu bayere ùtú anāturu ndi nsọ, dika m'nyere nzukọ Kraist di na Galetia iwu, unu onwe-unu me kwa otú a.
2 Kwa ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa ka unu nile n'otù n'otù debe ihe n'ulo nākpado ya, otú ihe nāgara onye ọ bula nke-ọma, ka aghara inara ùtú mb͕e ọ bula m'gābia.
3 Ma mb͕e ọ bula m'biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m'gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem:
4 ma asi na ọ kwesiri ka mu onwem je kwa, ha gēsom je.
5 Ma m'gābiakute unu, mb͕e ọ bula m'gāgabigasi nime Masedọnia; n'ihi na agajem igabiga nime Masedọnia;
6 ma eleghi anya na nke unu ka m'gānọgide, ma-ọbu nọbiga kwa na mb͕e oyi, ka unu we dupum n'ijem ebe ọ bula m'nāga.
7 N'ihi na achọghi m ihu unu ub͕u a n'uzọ ijem; n'ihi na anamele anya na m'gānọgide na nke unu oge ufọdu, ma asi na Onye-nwe-ayi gēkwe.
8 Ma m'gānọgide n'Efesọs rue oge Pentikọst;
9 n'ihi na emegheworom ọnu-uzọ di uku nke agēji kwa lusi ọlu ike, ọzọ, ọtutu ndi nēmegidem.
10 Ma asi na Timọti abia, lezienu anya ka ọ nọgide na nke unu nātughi egwu; n'ihi na ọ nālu ọlu Onye-nwe-ayi, dika mu onwem nālu kwa:
11 ya mere, ka onye ọ bula ghara ikpọ ya ihe-efu. Kama dupunu ya n'ije-ya n'udo, ka o we biakutem: n'ihi na anamele anya na ọ gēso umu-nna-ayi bia.
12 Ma okwu bayere Apọlos nwa-nna-ayi, ariọrọm ya ọtutu aririọ ka o so umu-nna-ayi biakute unu: ma ihe ọ chọrọ abughi ka ọ bia ub͕u a ma-ọli; ma ọ gābia mb͕e ọ bula o nwere oghere.
13 Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.
14 Ka eme ihe-unu nile n'ihu-n'anya.
15 Ma ariọm unu, umu-nnam, (unu matara èzí-na-ulo Stefanas, na ọ bu nkpuru mbu nke Akaia, na ha do-kwa-ra onwe-ha ijere ndi nsọ ozi),
16 ka unu onwe-unu do kwa onwe-unu n'okpuru madu di otú a, na n'okpuru onye ọ bula nke soro ayi nālukọ ọlu, onye nādọb͕u kwa onwe-ya n'ọlu.
17 Anamaṅuri kwa ọṅu n'ọbibia nke Stefanas na Fọtunetọs na Akaikọs: n'ihi na ndi ahu mezuru ihe fọduru unu imerem.
18 N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.
19 Nzukọ Kraist nile nke di n'Esia nēkele unu. Akwila na Priska nēkele unu ọtutu ekele nime Onye-nwe-ayi, ha na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.
20 Umu-nna-ayi nile nēkele unu. Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.
21 Ekele nke mu Pọl, nke m'ji aka nkem de.
22 Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n'anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.
23 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.
24 Ihu-n'anya nkem diyere unu nile nime Kraist Jisus. Amen.