Jọn

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21


Isi 9

Mb͕e Ọ nāgabiga, Ọ hu otù nwoke nke kpuru ìsì site n'ọmumu-ya.
2 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Rabai, ònye mehiere, onye a, ma-ọbu ndi muru ya, nke mere ka amua ya n'ìsì?
3 Jisus zara, si, Onye a emehieghi, ndi muru ya emehieghi kwa: kama ka ọlu Chineke we puta ìhè n'aru ya.
4 Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu.
5 Mb͕e ọ bula M'nọ n'uwa, abum Ìhè nke uwa.
6 Mb͕e O kwusiri ihe ndia, Ọ bua ọnu-miri n'ala, were ọnu-miri ahu gwọ ájá, were ájá ahu te n'anya-ya abua,
7 si ya, Je sa miri n'ọdọ-miri ntà nke Sailoam (nke bu, ma asugharia ya, Onye eziteworo). Ya mere O jere, sa miri, bia kwa nāhu uzọ.
8 Ya mere ndi-ab͕ata-obi-ya, na ndi nāhu ya-ri n'oge gara aga, na ọ bu onye-aririọ, ha nāsi, Onye a, ọ̀ bughi onye nānọ ala nāriọ kwa aririọ?
9 Ndi ọzọ nāsi, Ọ bu ya; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama o yiri ya. Ya onwe-ya siri, Mu onwem bu ya.
10 Ya mere ha nāsi ya, Èsi kwa aṅa meghe anya-gi?
11 Onye ahu zara, si, Nwoke ahu anākpọ Jisus gwọrọ ájá, te kwa ya n'anyam abua, sim, Je Sailoam, sa miri: ya mere ejerem, sa miri, ewe me ka M'hu uzọ.
12 Ha si ya, Òle ebe Onye ahu nọ? Ọ si, Amataghm.
13 Ha kutara ndi-Farisi onye ahu nke kpuru ìsì n'oge gara aga.
14 Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi Jisus gwọrọ ájá, we meghe anya-ya.
15 Ya mere ndi-Farisi ju-kwa-ra ya ọzọ otú emere ọ hu uzọ. Ọ si ha, Ọ tukwasiri ájá n'anyam abua, m'we sa miri, nāhu kwa uzọ.
16 Ya mere ufọdu n'etiti ndi-Farisi nāsi, Nwoke a esiteghi n'ebe Chineke nọ, n'ihi na O dighi-edebe ubọchi-izu-ike. Ma ndi ọzọ nāsi, Nwòke bu onye-nmehie si aṅa pu ime ihe-iriba-ama di otú a? Nkewa we di n'etiti ha.
17 Ya mere ha si onye-ìsì ahu ọzọ, Gini ka gi onwe-gi nēkwu bayere Ya, n'ihi na O meghere anya-gi? Ọ si, Ọ bu onye-amuma.
18 Ya mere ndi-Ju ekweghi okwu bayere ya, na o kpururi ìsì, na eme-kwa-ra ya ka ọ hu uzọ, rue mb͕e ha kpọrọ ndi muru onye ahu emere ka ọ hu uzọ,
19 we jua ha, si, Onye a, ọ̀ bu nwa-unu, onye unu nāsi na amuru ya n'ìsì? ò si kwa aṅa hu uzọ ub͕u a?
20 Ndi muru ya zara, si, Ayi matara na onye a bu nwa-ayi, na amu-kwa-ra ya n'ìsì:
21 ma otú ọ nāhu uzọ ub͕u a, ayi amataghi; ma-ọbu onye meghere anya-ya, ayi onwe-ayi amatagh: juana ya; o ruwo dìnkpà; ya onwe-ya gēkwuru onwe-ya.
22 Ihe ndia ka ndi muru ya kwuru, n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na ndi-Ju kwekọrọri n'etiti onwe-ha ub͕u a, ka esi n'ulo-nzukọ chupu onye ọ bula, ma ọ buru na ọ gēkwuputa na Ọ bu Kraist.
23 N'ihi nka ndi muru ya siri, O ruwo dìnkpà; juana ya.
24 Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie.
25 Ya mere onye ahu zara, si, Ma Ọ bu onye-nmehie, amataghm: otù ihe ka m'matara, na, ebe m'kpururi ìsì, ub͕u a anamahu uzọ.
26 ya mere ha siri ya, Gini ka O mere gi? Ò si aṅa meghe anya-gi?
27 Ọ zara ha, si, Agwaram unu ọbuná ub͕u a, ma unu anugh: gini mere unu nāchọ inu ya ọzọ? ùnu onwe-unu nāchọ kwa ighọ ndi nēso uzọ-Ya?
28 Ha we kwutọ ya, si, Gi onwe-gi bu onye nēso uzọ Onye ahu; ma ayi onwe-ayi bu ndi nēso uzọ Moses.
29 Ayi onwe-ayi matara na Chineke agwawo Moses okwu: ma Onye a, ayi amataghi ebe O si puta.
30 Nwoke ahu zara, si ha, Ekwula, n'ihi na ihe-ebube di na nka, na unu onwe-unu amataghi ebe O si puta, ma Ọ meghere anyam.
31 Ayi matara na Chineke adighi-anu olu ndi-nmehie: kama ọ buru na onye ọ bula bu onye nēbi isi ala nye Chineke, nēme kwa ihe Ọ nāchọ, onye ahu ka Ọ nānu.
32 Site na nmalite oge a ọ dighi mb͕e anuru na onye ọ bula meghere anya onye amuru n'ìsì.
33 Ọ buru na Onye a esiteghi n'ebe Chineke nọ, Ọ pughi ime ihe ọ bula.
34 Ha zara, si ya, Amuru gi onwe-gi nime nmehie, ọ̀ bu gi onwe-gi nēzí kwa ayi ihe? Ha we chupu ya n'èzí.
35 Jisus nuru na ha chupuru ya-ri n'èzí; O we chọta ya, si, Gì onwe-gi kwere n'Ọkpara Chineke?
36 Onye ahu zara, si, Ọ̀ bu kwa onye, Onye-nwe-ayi, ka m'we kwere na Ya?
37 Jisus siri ya, I huwo Ya, Onye gi na Ya nēkwu okwu bu kwa Onye ahu.
38 O we si, Onye-nwe-ayi, ekwem. O we kpọ isi ala nye Ya.
39 Jisus we si, Ọ bu ikpé ka Mu onwem ji bia n'uwa nka, ka ndi nāhughi uzọ we hu; ka ndi huru uzọ we ghọ kwa ndi-ìsì.
40 Ndi di n'etiti ndi-Farisi ndi ha na Ya nọ nuru ihe ndia, ha we si Ya, Àyi onwe-ayi kpu-kwa-ra?
41 Jisus siri ha, Ọ buru na unu kpuru ìsì, unu agaghi-enwe nmehie: ma ub͕u a unu nāsi, Ayi nāhu uzọ: nmehie-unu nānọgide.