Jọn

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21


Isi 2

N'ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n'ebe ahu:
2 ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu.
3 Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine.
4 Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi.
5 Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.
6 Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù.
7 Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n'ọnu.
8 O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya.
9 Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu,
10 si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a.
11 Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.
12 Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.
13 Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem.
14 Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala:
15 O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru;
16 Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia.
17 Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam.
18 Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia?
19 Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu.
20 Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ?
21 Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya.
22 Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.
23 Ma mb͕e Ọ nọ na Jerusalem n'ememe ngabiga, n'ememe ahu, ọtutu madu kwere n'aha-Ya, n'ihi na ha nāhu ihe-iriba-ama-Ya nile nke Ọ nēme.
24 Ma Jisus onwe-ya araraghi Onwe-ya nye n'aka-ha na ntukwasi-obi, n'ihi na Ọ mara madu nile,
25 ya na n'ihi na ọ dighi Ya nkpà ka onye ọ bula b͕ara madu àmà; n'ihi na Ya onwe-ya mara ihe di nime madu.