Zekaraia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14


Isi 9

Ibu okwu Jehova nke eboro ala Hadrak, Damaskọs gābu kwa ebe-izu-ike-ya: n'ihi na n'ebe Jehova nọ ka anya madu na nke mba nile nke Israel di:
2 na Hemat nke nwe-kwa-ra ókè-ala-ya: Taia na Zaidon, n'ihi na ọ mara ihe nke-uku.
3 Taia we wuere onwe-ya ebe ewusiri ike, tukọba ọla-ọcha dika ájá, na ọla-edo ọma dika apiti nke amá.
4 Le, Onye-nwe-ayi gānapu ya ala-ya, tikue ike-ya n'oké osimiri, ọ bu kwa ya onwe-ya ka ọku gēripia.
5 Ashkelon gāhu ya, tua egwu; Geza kwa, ọ gāb͕ali kwa nke-uku; Ekron kwa, n'ihi na ihere gēme ntukwasi-obi-ya: eze gālanari kwa Geza n'iyi, madu agaghi-ebi kwa n'Ashkelon.
6 Nwa iko gēbi kwa n'Ashdod, M'gēbipu kwa npako ndi Filistia.
7 M'gēwezuga kwa ọbara nile ya n'ọnu-ya, wezuga kwa ihe-árú-ya nile n'etiti ezé-ya; ọ gāfọdu-kwa-ra Chineke-ayi, ọbuná ya onwe-ya: ọ gādi kwa ka otù onye-isi nke nnù madu abua na ọgu iri nime Juda, Ekron gādi kwa ka onye Jebus.
8 M'gāma-kwa-ra ulom ulo-ikwū, dika ebe-nguzo-ndi-agha, n'ihi onye-ngabiga na n'ihi onye nālata: ka onye nāchi n'ihe-ike we ghara igabiga kwa n'akuku ha ọzọ: n'ihi na ub͕u a ka M'jiworo anyam abua hu.
9 Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.
10 M'gēbipu kwa ub͕ọ-ala n'Efraim, bipu kwa inyinya na Jerusalem, agēbipu kwa uta agha; Ọ gāgwa kwa mba nile okwu udo:Ọ gāchi kwa achi site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.
11 Gi onwe-gi kwa, n'ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M'zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n'olùlù nke miri nādighi nime ya.
12 Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi.
13 N'ihi na azọworom Onwem Juda ukwu ikwe ya dika uta, uta ahu ka M'mejuworo n'Efraim dika àkú; M'gākpọte kwa umu-gi, Zaion, imegide umu-gi, Jevan, M'gēme kwa gi ka i di ka mma-agha dike.
14 Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n'elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n'oké ifufe di iche iche nke Ndida.
15 Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà.
16 Jehova, bú Chineke-ha, gāzọputa kwa ha n'ubọchi ahu dika ìgwè ewu na aturu ahu, bú ndi-Ya: N'ihi na nkume di oké ọnu-ahia nke okpu-eze ka ha gābu, ndi eweliworo elu dika ọkọlọtọ n'elu ala-Ya.
17 N'ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.