Zekaraia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14


Isi 10

Riọnu Jehova miri-ozuzo n'oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n'ubi-ya.
2 N'ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n'efu ka ha nākasi madu obi: n'ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n'ala, n'ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere.
3 N'aru ndi-ọzùzù-aturu ka iwem di ọku, ọ bu kwa nkpi nile ka M'gēji nmehie-ha leta: n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha eletawo ìgwè ewu na aturu-Ya, bú ulo Juda, Ọ gēme kwa ha ka ha di ka inyinya-Ya di ebube n'agha.
4 N'aka-Ya ka nkume nkuku gēsi puta, n'aka-Ya ka ǹtú gēsi puta, n'aka-Ya ka uta agha gēsi puta, n'aka-Ya ka onye ọ bula nāchi n'ihe-ike gēsi puta n'otù.
5 Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n'apiti èzí nile n'agha; ha gēbu kwa agha, n'ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya.
6 M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.
7 Ndi Efraim gādi kwa ka dike, obi-ha gāṅuri kwa ọṅu dika site na manya-vine: e, umu-ha gāhu ya, we ṅuria; obi-ha gēteghari egwú ọṅù nime Jehova.
8 M'gākpọkọta kwa ha òkù, chikọta ha; n'ihi na ab͕aputawom ha: ha gāba kwa uba otú ha baworo uba.
9 M'gāgha kwa ha dika nkpuru n'etiti ndi nile di iche iche; ọ bu kwa n'ebe nile di anya ka ha gēchetam: ha gādi kwa ndu, ha na umu-ha, we lata.
10 M'gēme kwa ka ha si n'ala Ijipt lata, ọ bu kwa n'Asiria ka M'gāchikọputa ha; ọ bu kwa ala Gilead na Lebanon ka M'gēme ka ha bata; agaghi-ahu-kwa-ra ha ọnọdu.
11 Ọ gāgabiga kwa n'oké osimiri nke nkpab͕u, tie oké osimiri nke ọtutu nmali-miri, ebe di omimi nile nke Nail gātakọrọ kwa: agēbuda kwa npako Asiria n'ala, nkpa-n'aka Ijipt gēwezuga kwa onwe-ya.
12 M'gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n'aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.