Nehum

1 2 3


Isi 3

Ahuhu diri obodo ọbara! o juputasiri n'okwu-ugha na ndọka; ndọb͕u-anu adighi-apu na ya.
2 Ge nti olu utali, na olu nke ùzù wheel; na inyinya nāwuli awuli, na ub͕ọ-ala nāmali amali;
3 na onye-inyinya nēme ka inyinya-ya rigo, na mma-agha nēb͕upu eb͕upu, na ube nēb͕u àmùmà; na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u, na oké obo ozu; ọ dighi kwa ọgwugwu diri ozu-ha; ha nāsu ngọngọ n'ozu-ha:
4 n'ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n'ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile.
5 Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēkpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi n'iru-gi, me ka mba nile hu ọtọ-gi, na ala-eze nile ka ha hu ihere-gi.
6 M'gātukwasi kwa gi ihe-árú di iche iche, M'gākpọ kwa gi ihe-nzuzu, do gi ka ihe ile anya.
7 O gēru kwa, na ndi nile ndi nāhu gi gāb͕anari gi, si, Ebibiwo Nineve: ònye gēgosi ya ebere o ji n'aru ya? Òle ebe M'gāchọputara gi ndi-nkasi-obi?
8 Ì di nma kari No-amon, nke bi n'etiti osimiri Nail nile, nke miri di ya buruburu; nke ékpè-ya bu oké osimiri, oké osimiri ka mb͕idi-ya sitere?
9 Etiopia bu ume-ya, ya na Ijipt, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ya; Put na Lubim buri ndi-iye-aka-gi.
10 Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n'ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n'agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n'isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ.
11 Gi onwe-gi gāṅubiga kwa manya ókè, i gābu onye zoro ezo; gi onwe-gi gāchọ kwa ebe siri ike, n'ihi onye-iro.
12 Ebe-gi nile ewusiri ike gādi ka osisi fig nwere nkpuru-osisi fig buru uzọ cha: ọ buru na arùru ha arù, ha adabá n'ọnu onye nēri ha.
13 Le, ndi-gi bu ndinyom n'etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile.
14 Sere onwe-gi miri nke nnọchigide-n'agha, me ka ebe-gi nile ewusiri ike sie ike: ba n'urọ, zọta ájá, jide ihe eji akpu brick.
15 N'ebe ahu ka ọku gēripia gi; mma-agha gēbipu gi, ọ gēripia gi dika ukpala: me onwe-gi ka i rie nne dika ukpala, me onwe-gi ka i rie nne dika igurube.
16 I mewo ka ndi-ahia-gi ba uba kari kpakpando nke elu-igwe: ukpala enwopuwo iwere-ya, felaga.
17 Ndi-gi ekpubeworo okpu-eze di ka igurube, ndi-ọchi-agha-gi di kwa ka ìgwè igurube, ndi nēbe n'ogige ab͕ara ab͕a n'ubọchi juru oyi, ma mb͕e anyanwu wara ha felaga, amaghi kwa ọnọdu-ha ebe ha nọ.
18 Ndi-ọzùzù-aturu-gi atuwo òrù-ura, gi eze Asiria: ndi-ebube-gi nwere ebe-obibi-ha n'ájá: ndi-gi ab͕asawo n'elu ugwu nile, ọ dighi kwa onye-nchikọta ha nwere.
19 Ọ dighi nbilata nb͕aji ab͕ajiri gi nwere; ntiputa-ọnyá-gi jọrọ njọ: ndi nile ndi nānu ihe-ọnunu bayere gi gākukpo gi aka-ha; n'ihi na ònye ka ihe ọjọ gi nāgabigaghi n'isi-ya mb͕e dum?