Nehum

1 2 3


Isi 2

Onye-nchusa arigotawo n'iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku.
2 N'ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n'ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo.
3 Ọta ndi-dike-ya bu ihe esijiri ọbara-ọbara, ndi-dìnkpà-ya yiri uwe nācha uhie uhie: ígwè nēb͕upu eb͕upu ka ub͕ọ-ala-ya nwere n'ubọchi ndozi-ya, emewo ka osisi fir nile me nkpatu nke-uku.
4 N'èzí nile ka ub͕ọ-ala nile kpọtuworo nkpọtu nke-uku, ha nāb͕aghari iru na azu n'amá nile: ha di ka ọwa nēnwu enwu n'ile ha anya, dika àmùmà ka ha nāb͕a ọsọ.
5 Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n'ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n'agha.
6 Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya.
7 Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka.
8 Ma Nineve di ka ọdọ-miri juputara na miri site n'ubọchi nile ya onwe-ya di: ma ndi ahu nāb͕alaga; Guzonu, guzonu, ka ha nāsi; ma ọ dighi onye nāgha anya n'azu.
9 Lutanu ọla-ọcha n'agha lutanu ọla-edo n'agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n'ihe nile anāchọsi ike.
10 Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n'úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa.
11 Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.
12 Ọdum nādọb͕u anu gēzuru umu-ya, ọ nātọb͕uta-kwa-ra nne-ọdum-ya nile anu, we kpojue ọb͕à-ya nile n'anu-ndọb͕u, kpoju kwa ebe-obibi-ya nile n'anu ọ dọb͕uworo.
13 Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.