Abù-Ákwá

1 2 3 4 5


Isi 5

Jehova, cheta ihe ruworo ayi aru: Legide anya, hu ita-uta-ayi.
2 Ihe-nketa-ayi ab͕anwewo ihe ndi ala ọzọ, Ulo nile ab͕anwewo ihe ndi mba ọzọ.
3 Umu-nb͕ei ka ayi ghọworo, bú ndi nēnweghi nna, Nne-ayi-hà di ka ndinyom di-ha nwuru.
4 Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua; Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.
5 Ọ bu inọkwasi n'olu-ayi ka achuworo ayi: Ayi adọb͕uwo onwe-ayi n'ọlu, ma ekweghi ka ayi zuru ike.
6 Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye, Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.
7 Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu; Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.
8 Ndi-orù achiwo ayi: Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.
9 Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayi N'ihi mma-agha nke ọzara.
10 Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku uku Site n'ifufe di ọku nke oké ugwu.
11 Ndinyom nke di na Zaion ka ha wedara n'ala, Ha na umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke n'obodo nile nke Juda.
12 Ekobere ndi-isi n'aka-ha: Asọpughi iru ndi-okenye.
13 Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri, Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.
14 Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama, Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.
15 Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo; Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.
16 Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala: Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo.
17 N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma; N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.
18 N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.
19 Gi onwe-gi, Jehova, ọ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I nānọdu dika eze; Oche-eze-Gi nādiru ọb͕ọ nile.
20 N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?
21 Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa; Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.
22 Ma-ọbughi na I jusiwo ayi, Wesa ayi iwe nke-uku.