Abù-Ákwá

1 2 3 4 5


Isi 1

Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.
2 Ọ nākwasi ákwá ike n'abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua; Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n'etiti ndi nile nāhu ya n'anya: Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya, Ha aghọworo ya ndi-iro.
3 Juda ejewo ibiri n'ala ọzọ site na nweda-n'ala, na site n'iba-uba nke ọbubu-orù; Ya onwe-ya ebiriwo n'etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike: Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n'ebe di nkpà.
4 Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n'ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà; Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n'efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:
5 Ndi nākpab͕u ya aghọwo ndi-isi, ndi-iro-ya nọ n'udo; N'ihi na Jehova emekpawo ya aru n'ihi iba-uba nke njehie-ya nile: Umu-ntakiri-ya alawo dika ndi adọtara n'agha n'iru onye-nkpab͕u.
6 Ima-nma-ya nile esiwo kwa n'aru ada Zaion pua: Ndi-isi-ya aghọwo ele nke nāchọtaghi ebe-ita-nri, Ha we je ije nēnweghi ike n'iru onye nāchu ha.
7 Jerusalem echetawo n'ubọchi nile nke nweda-n'ala-ya na nke nwaghari-ya nile Ihe nile ya anāchọsi ike nke diri site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie: Mb͕e ndi-ya dabàra n'aka onye-nkpab͕u, ma ọ dighi onye nēyere ya aka, Ndi-nkpab͕u huru ya, ha chìri nkwusi-ya nile ọchì.
8 Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú: Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya: E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.
9 Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya; O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere: Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku.
10 Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem: N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya, Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.
11 Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri; Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi: Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.
12 Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ? Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu, Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.
13 N'elu ka O siri zite ọku n'ọkpukpum nile, o we nwe ike n'aru ha: Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m'laghachi azu; O mewom ka m'ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.
14 Aka-Ya ekewo yoke nke njehiem nile; Akpakọwo ha n'otù, ha arigotawo n'olum; O mewo ka ikem su ngọngọ: Onye-nwe-ayi enyewom n'aka-ha, bú ndi m'nāpughi iguzosi ike megide.
15 Onye-nwe-ayi eledawo ndim nile di ebube anya n'etitim: Ọ kpọsawo mb͕e akara àkà imegidem itipia umu-okorọbiam: Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka Onye-nwe-ayi zọchaworo nye ada Juda nāmaghi nwoke.
16 N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri; N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ; Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike.
17 Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere; Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya: Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n'etiti ha.
18 Onye ezi omume ka Jehova bu; n'ihi na okwu-ọnu-Ya ka m'nupuworo isi megide: Biko, nurunu, unu ndi nile di iche iche, le-kwa-nu ihe-nb͕um: Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam alawo n'etiti ndi adọtara n'agha.
19 Akpọkurum ndi nāhum n'anya, ma ha onwe-ha ghọb͕urum: Ndi-nchu-àjàm na ndi-okenyem kubìri ume n'obodom, Mb͕e ha nāchọrọ onwe-ha ihe-oriri ka ha we weghachi nkpuru-obi-ha.
20 Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku; Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku: N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.
21 Ha anuwo na onye nēze ume ka m'bu; ọ dighi onye-nkasi-obi m'nwere; Ndi-irom nile anuwo ihe ọjọm; obi atọwo ha utọ na Gi onwe-gi emewo ya: I gēme ka ọ bia, bú ubọchi I kpọsaworo, ha ewe di ka mu onwem.
22 Ka ihe ọjọ nile ha bia n'iru Gi; Gi me kwa ha, dika I meworom n'ihi njehiem nile: N'ihi na ize-umem di ọtutu, aru adighi kwa obim ike.