Abù Nke Abù

1 2 3 4 5 6 7 8


Isi 4

Le, i mara nma, eyìm, le, i mara nma; Anya-gi abua di ka nduru n'azu ákwà-nkpuchi-gi: Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu, Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.
2 Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu nke akpachaworo aji-ha ọhu, Nke siworo n'isa-aru rigota; Nke ha nile chi umu abua umu abua, Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.
3 Dika ogho uhie ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua bu, Okwu-ọnu-gi ma-kwa-ra nma: Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi bu N'azu ákwà-nkpuchi-gi.
4 Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di, Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri, Bú ọta ntà nile nke ndi-dike.
5 Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru, Nke nāta nri n'etiti urodi.
6 Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa, Mu onwem gēje n'ugwu myrrh, Na n'ugwu ntà frankincense.
7 I mazuru nma, eyìm; Ọ dighi kwa ntupọ di n'aru-gi.
8 Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem, Si na Lebanon som: Site n'elu Amana le anya, Site n'elu Senia na Heamon, Site n'ebe-obibi nile nke ọdum. Site n'ugwu nile nke agu.
9 I riwo obim, nwa-nnem nwayi; I werewo otù nime anya-gi abua, I werewo kwa otù ihe-inya-n'olu site n'olu-gi, rie obim.
10 Le ka ihu-n'anya-gi nile si ma nma nke-uku, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem! Le ka ihu-n'anya-gi nile si di nma nke-uku kari manya-vine! Le kwa ka ísì utọ nke manu-gi nile di nma nke-uku kari uda nile!
11 Manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu abusi ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nābusi, nwunye ọhu nkem: Manu-aṅu na miri-ara-ehi di n'okpuru ire-gi; Ísì utọ nke uwe-gi nile di kwa ka ísì utọ Lebanon.
12 Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu; Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi.
13 Ome-gi nile bu ogige ọma nke pome-granate, nwere nkpuru di iche iche di oké ọnu-ahia; Henna, ya na osisi manu nard nile,
14 Manu nard na saffron, Calamus na cinnamon, ha na osisi nile nke frankincense; Myrrh na aloes, ha na isi uda nile.
15 Isi-iyi nke ubi nile ab͕ara ogige ka i bu, Olùlù-miri nke juputara na miri di ndu, Na miri-iyi di iche iche nke nērù erù site na Lebanon.
16 Teta, gi ifufe Ugwu; bia kwa, gi ifufe Ndida; Fekwasi ubim ab͕ara ogige, ka uda-ya di iche iche we rùpu. Ka onye ihe-ya nātọm utọ bata n'ubi-ya ab͕ara ogige, We rie nkpuru-ya di iche iche nke di oké ọnu-ahia.