Abù Nke Abù

1 2 3 4 5 6 7 8


Isi 3

N'elu ihe-ndinam n'abali ka m'chọrọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.
2 M'siri, Biko, ka m'bilie, jegharia n'obodo buruburu, N'amá nile na n'ebe nile sara mbara, Ka m'chọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.
3 Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum: M'we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya?
4 Ọ bu nání nwantī ka m'siri n'ebe ha nọ gabiga, Mb͕e m'chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Ejiderem ya, arakwaghm ya aka, Rue mb͕e m'mere ka ọ ba n'ulo nnem, Na n'ime-ulo nke nwayi turu imem.
5 Unu umu-ndinyom Jerusalem, Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi, Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma-ọli, Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.
6 Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku, Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense, Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?
7 Le, ọ bu ihe-ndina-ya, bú nke Solomon nwere; Ọgu ndi-dike atọ di ya buruburu, Site na ndi-dike nke Israel.
8 Ha nile ji mma-agha, ha bu ndi emeworo ka ha muta ibu agha: Onye ọ bula, mma-agha-ya di n'úkwù-ya, N'ihi egwu n'abali.
9 Eze, bú Solomon, emeworo onwe-ya otù palanquin Site n'osisi Lebanon.
10 Ogidi-ya nile ka o jiri ọla-ọcha me, Ala-ya ka o jiri ọla-edo me, ebe-ọnọdu-ya ka o jiri ogho ododo me, Etiti-ya, eji ihu-n'anya me ka ọ buru pavement ọma, Site n'aka umu-ndinyom Jerusalem.
11 Puanu, umu-ndinyom Zaion, lekwasi Solomon, bú eze, anya, Ka o kpuru okpu-eze nke nne-ya kpubeworo ya n'ubọchi ọlulu-nwunye-ya, Na n'ubọchi ọṅù nke obi-ya.