Eklisiastis

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12


Isi 6

Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ihe riri nne ka ọ bu kwa n'aru madu:
2 madu onye Chineke nēnye àkù na ihe-nkpakọta na nsọpuru, ọ dighi kwa ihe kọnariri nkpuru-obi-ya nime ihe nile nke ọ nāchọsi ike, ma Chineke adighi-eme ka o nwe ike iri nime ya, kama onye ala ọzọ nēri ya; nka bu ihe-efu, ọria ọjọ ka ọ bu kwa.
3 Ọ buru na nwoke amuta ọgu umu ise, di kwa ndu ọtutu arọ, ubọchi nke arọ-ya ewe ba uba, ma afọ adighi-eju nkpuru-obi-ya n'ezi ihe, ọzọ kwa, ọ dighi olìlì diri ya; asiwom, na nwa amukworo amukwo di nma kari ya:
4 N'ihi na n'ihe-efu ka ọ biara, ọ bu kwa n'ọchichiri ka ọ nāla, eji kwa ọchichiri kpuchi aha-ya;
5 ọzọ, ọ hughi anyanwu, ọ maghi kwa ihe ọ bula; izu-ike diri nka kari onye ahu:
6 e, ọ buru na ọ di ndu nnù arọ abua na ọgu iri okpukpu abua, ma ọ hughi ezi ihe: ọ̀ bughi n'otù ebe ka ha nile nāla?
7 Ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu diri ọnu-ya, ma otú ọ di, ọchichọ nkpuru-obi adighi-eju eju.
8 N'ihi na gini ka onye mara ihe nwebigara ókè kari onye-nzuzu? ma-ọbu gini ka onye ewedara n'ala nwere, bú onye mara ijeghari n'iru ndi di ndu?
9 Ọ di nma, bú ihe-ọhuhu nke anya abua, kari njeghari nke nkpuru-obi: nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.
10 Ihe nke diworo, ọ bu na mb͕e di anya gara aga ka akpọrọ aha-ya, amawo kwa na nke ahu bu madu: ọ pughi kwa iluso onye ka ya ike ọ̀gù.
11 Ebe ọtutu okwu di nke nēme ka ihe-efu ba uba, gini ka madu nwebigara ókè?
12 N'ihi na ònye mara ihe diri madu nma na ndu-ya, ọnu-ọgugu ubọchi ndu efu ya nke ọ nēme dika onyinyo? n'ihi na ònye gēgosi madu ihe gādi n'okpuru anyanwu mb͕e ọ gasiri?