Eklisiastis

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12


Isi 5

Debe ukwu-gi mb͕e i nējeru ulo Chineke; n'ihi na ibiaru nso inu anu di nma kari ichu àjà ndi-nzuzu: n'ihi na ha adighi-ama na ha nēme ihe ọjọ.
2 Ekwela ka ọnu-gi kwue okwu ọsọsọ, eme-kwa-la ka obi-gi me ngwa iweputa okwu n'iru Chineke; n'ihi na Chineke nọ n'elu-igwe, ma gi onwe-gi nọ n'elu-uwa: n'ihi nka me ka okwu-gi di ole-na-ole.
3 N'ihi na nrọ abiawo n'ọtutu ije-ozi, olu onye-nzuzu kwa n'ọtutu okwu.
4 Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n'ikwughachi ya; n'ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya.
5 Ọ di nma ka i ghara ikwe nkwa, kari ikwe nkwa ma i dighi-akwughachi.
6 Ekwela ka ọnu-gi me anu-aru-gi ka o mehie; asi-kwa-la n'iru onye-ozi Chineke, na ọ bu n'amaghi-ama ka emere ya: n'ìhi gini ka Chineke gēwe iwe megide olu-gi, we mebie ọlu nke aka-gi abua?
7 N'ihi na n'ọtutu nrọ na ihe-efu ka ọtutu okwu di kwa: ma tua egwu Chineke.
8 Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n'ike n'ala anāchi achi, ibobo anwula gi n'ihe ahu anēme: n'ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n'elu ha.
9 Ọzọ, njubiga-ókè nke ala, ọra madu ka ọ diri: ọbuná eze ka ubi nēfè òfùfè.
10 Onye nāhu ego n'anya, ego agaghi-eju ya afọ; ọzọ, onye nāhu inwe ihe bara uba n'anya, ihe onwunwe agaghi-eju ya afọ: nka bu kwa ihe-efu.
11 Mb͕e ezi ihe nāba uba, ndi nēri ya abawo kwa uba: òle ngazi ọ nāgaziri onye-nwe-ya, ma-ọbughi iji anya-ya abua hu ya?
12 Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura.
13 Ihe ọjọ nke nēb͕u di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, bú àkù nke onye-nwe-ya nēdebe imejọ onwe-ya:
14 àkù ahu we la n'iyì site na nweda-n'ala ọjọ; ọ buru kwa na ọ muwo nwa-nwoke, ọ dighi ihe ọ bula di ya n'aka.
15 Dika o siri n'afọ nne-ya puta, puta n'ọtọ, out a ka ogālaghachi di ka ila dika o siri bia, ma ọ dighi ihe ọ bula o gēburu site na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, nke ọ gēwere n'aka-ya la.
16 Nka bu kwa ihe ọjọ nēb͕u nb͕u, na n'ihe nile dika o siri bia, otú a ka ọ gāla: ọ̀ bu kwa ole ihe fọduru ya na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu inwe ifufe?
17 Ọzọ, n'ubọchi-ya nile ọ bu n'ọchichiri ka o nēri ihe, anākpasu kwa ya iwe ri nne, o nwe-kwa-ra ọria na iwe.
18 Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n'ihi na nka bu òkè-ya.
19 Ọzọ, madu ọ bula nke Chineke nyeworo àkù na ihe-nkpakọta, onye O mewo-kwa-ra ka o nwe ike iri nime ya, na ibūru òkè-ya, na iṅuri ọṅu nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu; nka bu onyinye Chineke.
20 N'ihi na ọ gaghi-echeta ubọchi nile nke ndu-ya ri nne; n'ihi na Chineke nāza ya n'ọṅù obi-ya.