Ilu
Isi 2
Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile,
Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;
2 Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala,
We wezuga obi-gi inwe nghọta;
3 E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,
Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;
4 Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,
Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:
5 Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,
Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.
6 N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe;
N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:
7 O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,
Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;
8 Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,
Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.
9 Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,
Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.
10 N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi,
Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;
11 Ìzùzù ganēche gi nche,
Nghọta gēchebe gi:
12 Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ,
N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;
13 Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi,
Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;
14 Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,
Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;
15 Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ,
Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:
16 Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi,
N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;
17 Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ,
Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:
18 N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,
Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.
19 Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata,
Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:
20 Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma,
Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.
21 N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa,
Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.
22 Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa,
Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.