Ilu
Isi 18
Ọchichọ nke ya onwe-ya nāchọsi ike ka onye nēkewapu onwe-ya nāchọ,
Ọ bu ezi nzube-ihe nile ka ọ nālusosi ọ̀gù ike.
2 Nghọta adighi-atọ onye-nzuzu utọ,
Kama ọ bu nání ka obi-ya we kpughe onwe-ya.
3 Mb͕e onye nēmebi iwu nābata, nleda-anya abatawo kwa,
Ọ bu kwa nlelì ka ita-uta soro.
4 Miri nke miri emi ka okwu nile nke ọnu madu bu;
Iyi nērù erù ka isi-iyi amam-ihe bu.
5 Ihu onye nēmebi iwu iru-ọma adighi nma,
Iwezuga onye ezi omume n'ikpé.
Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye-nzuzu nābà n'ilu-ọ̀gù,
6 Ọnu-ya nākpọ kwa iti-ihe òkù.
7 Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi,
Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.
8 Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri nātọ utọ nke-uku,
Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.
9 Ọzọ, onye di ume-ngwu n'ije-ozi-ya,
Onye ahu bu nwa-nne nke onye-nwe nbibi.
10 Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu:
Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.
11 Àkù ọgaranya bu obodo-ya siri ike,
Ọ di kwa ka mb͕idi di elu nime ntughari-obi-ya nile.
12 N'iru ntipia ka obi madu di elu,
Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.
13 Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu,
Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.
14 Mọ madu gānagide ọria-ya;
Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u, ònye gēburu ya?
15 Obi onye-nghọta nēnweta ihe-ọmuma;
Ọzọ, nti ndi mara ihe nāchọ ihe-ọmuma.
16 Onyinye madu nākwara ya uzọ sara mbara,
Ọ bu kwa n'iru ndi uku ka o nēdu ya je.
17 Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya;
Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.
18 Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi,
Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.
19 Nwa-nne ejehieworo megide di ike iwere kari obodo siri ike:
Ise-okwu di kwa ka ihe-ntuchi nile nke-elu.
20 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju afọ onye ọ bula;
N'ihe-omume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya ka afọ gēju ya.
21 Ọnwu na ndu di ire n'aka;
Ọzọ, ndi nāhu ya n'anya gēri nkpuru-ya.
22 Onye chọtaworo nwunye achọtawo ezi ihe,
Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.
23 Okwu aririọ-amara di iche iche ka ob͕eye nēkwu:
Ma ọgaranya nāza ike ike.
24 Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya:
Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.