Esta

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10


Isi 5

O rue, n'ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n'ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n'oche-eze ala-eze ya n'ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu.
2 O rue, mb͕e eze huru Esta, bú nwunye eze, ka o nēguzo n'ogige, na ọ natara amara n'anya-ya: eze we setipuru Esta nkpa-n'aka ọla-edo nke di n'aka-ya. Esta we biarue nso, metu isi nkpa-n'aka ahu.
3 Eze we si ya, Gini ka i nāchọ, Esta, nwunye eze? gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēnye kwa gi.
4 Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka eze na Heman bia ta n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nke m'meworo ya.
5 Eze we si, Menu ka Heman me ngwa ime ihe Esta kwuru. Eze na Heman we bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.
6 Eze we si Esta n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme ya.
7 Esta we za, si, Aririọm na ọchichọm bu;
8 ọ buru na ahutawom amara n'iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m'nāriọ, na ime ihe m'nāchọ, ka eze na Heman bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke m'gēmere ha, echi ka m'gēme kwa dika okwu eze si di.
9 Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n'obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n'ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n'iru ya, Heman juputara n'ọnuma megide Mọdekai.
10 Ma Heman jisiri onwe-ya ike, ba n'ulo-ya; o we ziga, me ka ndi nāhu ya n'anya bia, ha na Zeresh, bú nwunye-ya.
11 Heman we kọrọ ha akukọ bayere nsọpuru nke àkù-ya, na iba-uba nke umu-ya ndikom, na ihe nile nke eze ji me ka ọ di uku, nke o ji buli kwa ya ibu onye-isi nke ndi-isi na ndi-orù eze.
12 Heman we si, Ọzọ, Esta, bú nwunye eze, emeghi onye ọ bula ka o so eze bata n'ọṅuṅu-manya-vine nke o mere, ọ bu nání mu onwem; ọzọ kwa, echi ka akpọworo mu onwem jekuru ya, mu na eze.
13 Ma ihe a nile adighi-ezurum, na mb͕e nile mu onwem nāhu Mọdekai, bú onye-Ju, ka ọ nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze.
14 Zeresh, bú nwunye-ya, na ndi nile nāhu ya n'anya, we si ya, Ka ha me osisi nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, ma n'ututu gi si eze ka akwuba Mọdekai n'elu-ya: gi so kwa eze ba n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nāṅuri ọṅu. Okwu ahu we di nma n'anya Heman; o we me osisi ahu.