Esta

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10


Isi 10

Eze, bú Ahasuerọs, we me ka ala ahu na ala nile nke di oké osimiri buruburu tua utu.
2 Ma ọlu nile nke ike-ya na nke idi-ike-ya, na ọkukọ-isi nke idi-uku nke Mọdekai, bú nke eze mere ya ka ọ di uku, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Midia na Peasia?
3 N'ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n'etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.