Nehemaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13


Isi 5

Oké iti-nkpu nke ndi-ayi na ndinyom-ha we di megide umu-nne-ha, bú ndi-Ju.
2 N'ihi na ufọdu di ndi nāsi, Ayi onwe-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom, di ọtutu: kwe ka ayi nara ọka, ka ayi we rie ihe, we di ndu.
3 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile na ulo-ayi nile ka ayi nēdo n'ibé: kwe ka ayi nara ọka, n'ihi oké unwu a.
4 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ayi ewerewo ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile biri ego itu utu-ala eze.
5 Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n'etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile.
6 Iwem we di ọku nke-uku mb͕e m'nuru iti-nkpu-ha na okwu ndia.
7 Obim we duam ọdu, mu na ndi amara aha-ha na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si ha, Ọmuru-nwa ka unu onwe-unu nānara, nwoke ọ bula n'aka nwa-nne-ya. M'we nwe nkpọkọta uku megide ha.
8 M'we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza.
9 M'we si, Ọ dighi nma, bú ihe a nke unu onwe-unu nēme: ọ̀ bughi n'egwu Chineke ka unu gējeghari, n'ihi ita-uta nke ndi mba ọzọ, bú ndi-iro-ayi?
10 Ọzọ kwa, mu onwem na umu-nnem na ndi nējerem ozi nēbinye ha ego na ọka n'ọmuru-nwa. Biko, ka ayi rapu ọmuru-nwa nka.
11 Biko, burunu uzọ nyeghachi ha ubi nile ha, na ubi-vine nile ha, na ubi-olive nile ha, na ulo nile ha, na otù uzọ n'ọgu uzọ ise nke ego, na nke ọka, na nke manya-vine ọhu, na nke manu, nke unu nānara ha n'ọmuru-nwa.
12 Ha we si, Ayi gēnyeghachi ha, ayi agaghi-achọ kwa ihe n'aka ha; otú a ka ayi gēme, dika gi onwe-gi nēkwu. M'we kpọ ndi-nchu-àjà, me ka ha ṅua iyi ime dika okwu a si di.
13 Arurupu-kwa-ram obi-uwem, si, Ka Chineke rurupu nwoke ọ bula otú a site n'ulo-ya, site kwa na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, bú onye nādighi-eme ka okwu a guzosie ike; ọbuná otú a ya bu ihe arurupuworo, nke tọb͕ọ-kwa-ra n'efu. Nkpọkọta ahu nile we si, Amen, ha we to Jehova. Ndi-ayi we me dika okwu a si di.
14 Ọzọ, site n'ubọchi o nyerem iwu ibu onye nāchi ha n'ala Juda, site n'arọ nke-orú we rue arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Ataksakses, bú eze, nke ahu bu arọ iri na abua, mu onwem na umu-nnem erighi nri nke onye nāchi ala.
15 Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n'achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n'ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n'ihi egwu Chineke.
16 Ọzọ kwa, m'jisiri ike n'ije-ozi mb͕idi a, ọ dighi kwa ubi ayi zutara: ma achikọtawo ndi nile nējerem ozi n'ebe ahu ije ozi ahu.
17 Ọzọ, ndi-Ju na ndi nọchiri anya eze, bú ọgụ ndikom asa na iri, nọ na table nkem, ha na ndi nābiakute ayi site na mba ndi di ayi buruburu.
18 Ma ihe nke edoziworo bayere otù ubòchi bu otù ehi na aturu isi arọputara arọputa; edozi-kwa-ra umu-nnunu nyem, dozi kwa manya-vine nile ọ bula n'uba otù ub͕ò n'ubọchi iri: ma n'ihe a nile ọ dighi nri nke diri onye nāchi ala m'chọrọ, n'ihi na òfùfè ahu di arọ́ n'aru ndi nka.
19 Chinekem, chetaram ihe nile nke m'meworo n'ihi ndi nka, imerem ezi ihe.