Nehemaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13


Isi 10

Ma ndi bu ndi-isi n'ikà ihe nile akara akàrà bu, Nehemaia, bú Tiashata, nwa Hakalaia, na Zedekaia;
2 na Seraia, na Azaraia, na Jeremaia;
3 na Pashua, na Amaraia, na Malkija;
4 na Hatush, na Shebania, na Maluk;
5 na Harim, na Meremot, na Obadaia;
6 na Daniel, na Gineton, na Beruk;
7 na Meshulam, na Abaija, na Mijamin;
8 na Maazia, na Bilgai, na Shemaia; ndia bu ndi-nchu-àjà.
9 Ndi Livai kwa: bú Jeshua nwa Azania, na Binui nke sitere n'umu Henadad, na Kadmiel;
10 na umu-nne-ha, bú Shebania, na Hodia, na Kelita, na Pelaia, na Hanan;
11 na Maika, na Rehob, na Hashabaia;
12 na Zakua, na Sherebia, na Shebania;
13 na Hodia, na Bani, na Beninu.
14 Ndi-isi ndi Israel: bú Parosh, na Pahat-moab, na Ilam, na Zatu, na Bani;
15 na Buni, na Azgad, na Bebai;
16 na Adonaija, na Bigvai, na Adin;
17 na Atea, na Hezekaia, na Azua;
18 na Hodia, na Hashum, na Bezai;
19 na Harif, na Anatot, na Nobai;
20 na Magpiash, na Meshulam, na Hezia;
21 na Meshezabel, na Zedok, na Jadua;
22 na Pelataia, na Hanan, na Anaia;
23 na Hoshea, na Hananaia, na Hashub;
24 na Halohesh, na Pilha, na Shobek;
25 na Rehum, na Hashabna, na Maaseia;
26 na Ahia, na Hanan, na Anan;
27 na Maluk, na Harim, na Beana.
28 Ndi-ayi fọduru, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na Netinim, na onye ọ bula nke siworo n'etiti ndi iche iche nke ala ọzọ kewapuru iwu Chineke onwe-ya, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndiyom, onye ọ bula nke mara ihe, nke nāghọta kwa ihe;
29 ha nēkekọta onwe-ha n'aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n'ọb͕ub͕a-iyi na n'ọṅuṅu-iyi, ijeghari n'iwu Chineke, nke enyere site n'aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;
30 ọzọ kwa, na ayi agaghi-enye ndi di iche iche nke ala ahu umu-ayi ndinyom, na ayi agaghi-aluta-kwa-ra umu-ayi ndikom umu-ha ndinyom:
31 ọzọ, ndi di iche iche nke ala ahu ndi nēwebata ihe-ahia na ọka ọ bula n'ubọchi-izu-ike ire ere, na ayi agaghi-azuru n'aka-ha n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu n'ubọchi nsọ: ọzọ, na ayi gārapu arọ nke-asa na ihe-nbinye ọ bula.
32 Ayi me-kwa-ra ihe enyere n'iwu ka ha guzoro ayi, bú ibokwasi onwe-ayi otù uzọ n'uzọ atọ nke otù shekel n'arọ iji fè òfùfè ulo Chineke-ayi;
33 bayere achicha anēdebe n'usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi.
34 Ayi fe-kwa-ra nzà, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ayi nile, bayere onyinye iji biaru nso, bú nkú, iwebata ya n'ulo Chineke-ayi, dika ulo nna-ayi-hà si di, na mb͕e ezubere, kwa-arọ, isure n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, dika edeworo ya n'iwu:
35 na iwebata nkupuru mbu nke ala-ubi-ayi, na nkpuru mbu nke nkpuru nile nke osisi nile, kwa-arọ, n'ulo Jehova:
36 na umu eburu uzọ mu nke umu-ayi ndikom na nke anu-ulo-ayi, dika edeworo ya n'iwu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-ayi na nke ìgwè ewu na aturu-ayi, iwebata ha n'ulo Chineke-ayi, nye ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi n'ulo Chineke-ayi:
37 na ayi gēwebata-kwa-ra ndi-nchu-àjà utu ọka mbu ayi, na àjà-nbuli nile ayi, na nkpuru nke osisi nile ọ bula, na manya-vine ọhu, na manu, rue ime-ulo nke ulo Chineke-ayi; webata-kwa-ra ndi Livai otù uzọ n'uzọ iri nke ihe ala-ubi-ayi; n'ihi na ha onwe-ha, bú ndi Livai, nānara otù uzọ n'uzọ iri n'obodo nile nke ọlu-ubi-ayi.
38 Onye-nchu-àjà, bú nwa Eron, gānọye-kwa-ra ndi Livai, mb͕e ndi Livai nānara otù uzọ n'uzọ iri: ndi Livai gēwegota kwa otù uzọ n'uzọ iri nime otù uzọ n'uzọ iri nile rue ulo Chineke-ayi, rue ime-ulo, rue ulo àkù.
39 N'ihi na umu Israel na umu Livai gēwebata àjà-nbuli nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ime-ulo, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ihe nile nke ebe nsọ di, ha na ndi-nchu-àjà ndi nēje ozi, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù: ayi agaghi-arapu kwa ulo Chineke-ayi.