I. Ihe Emere

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29


Isi 8

Benjamin we mua Bela, bú ọkpara-ya, na Ashbel, bú nke-abua, na Ahara, bú nke-atọ;
2 na Noha, bú nke-anọ, na Rafa, bú nke-ise.
3 Bela we nwe umu-ndikom; Ada, na Gira, na Abaihud;
4 na Abishua, na Neaman, na Ahoa;
5 na Gira, na Shefufan, na Huram.
6 Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat:
7 na Neaman, na Ahaija, na Gira, onye ahu mere ka ha je biri n'ala ọzọ; ọ mua Uza na Ahaihud.
8 Shaharaim we mua umu n'ọhia Moab, mb͕e o zilagasiri ha; Hushim na Baara bu ndinyom-ya.
9 O we site na Hodesh, bú nwunye-ya, mua Jobab, na Zibia, na Misha, na Malkam;
10 na Jeuz, na Shakia, na Miama. Ndia bu umu-ya ndikom, ha bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna.
11 O site-kwa-ra na Hushim mua Abaitub na Elpaal.
12 Umu-ndikom Elpaal; Iba, na Misham, na Shemed; onye ahu wuru Ono na Lod, na umu-obodo-ya:
13 na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n'Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga;
14 na Ahio, na Shashak, na Jeremot;
15 na Zebadaia, na Arad, na Eda;
16 na Maikael, na Ishpa, na Joha, bú umu-ndikom Beria;
17 na Zebadaia, na Meshulam, na Hizki, na Heba;
18 na Ishmerai, na Izlia, na Jobab, bú umu-ndikom Elpaal;
19 na Jakim, na Zikri, na Zabdi;
20 na Elienai, na Ziletai, na Eliel;
21 na Adaia, na Beraia, na Shimrat, bú umu-ndikom Shimai;
22 na Ishpan, na Iba, na Eliel;
23 na Abdon, na Zikri, na Henan;
24 na Hananaia, na Ilam, na Antot a;
25 na Ifdeia, na Penuel, bú umu-ndikom Shashak;
26 na Shamsherai, na Sheharia, na Atalaia;
27 na Jaareshia, na Elaija, na Zikri, bú umu-ndikom Jeroham.
28 Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi. Ndia biri na Jerusalem.
29 Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka:
30 nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nedab;
31 na Gedoa, na Ahio, na Zeka.
32 Miklot we mua Shimea. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.
33 Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.
34 Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.
35 Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tarea, na Ehaz.
36 Ehaz we mua Jehoada; Jehoada we mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza:
37 Moza mua Binea; Rafa bu nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:
38 Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan. Ndia nile bu umu-ndikom Azel.
39 Umu-ndikom Ishek nwa-nne-ya nwoke kwa; Ulam, bú ọkpara-ya, na Jeush, bú nke-abua, na Elifelet, bú nke-atọ.
40 Umu Ulam we buru ndi-dike bu dìnkpà, ndi-ọb͕a-uta, ha nwe-kwa-ra ọtutu umu-ndikom, na umu umu, ọgu asa na iri. Ndia nile sitere n'umu Benjamin.