I. Ihe Emere

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29


Isi 24

Ekè-kwa-ra umu Eron òkè nile ha. Umu-ndikom Eron; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.
2 Nedab na Abaihu we nwua n'iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà.
3 Devid we kè ha, ya na Zedok, onye sitere n'umu Eleeza, na Ahimelek, sitere n'umu Itama, dika ihe-nlekọta-ha si di n'òfùfè-ha.
4 Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.
5 Ewe kè ha n'ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n'otù; n'ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n'umu Eleeza na n'etiti umu Itama.
6 Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama.
7 Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia;
8 nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim;
9 nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin;
10 nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija;
11 nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania;
12 nke-iri-na-otù putara Elaiashib, nke-iri-na-abua putara Jakim;
13 nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab;
14 nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea;
15 nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez;
16 nke-iri-na-iteghete putara Petahia, nke-orú putara Jehezkel;
17 nke-orú-na-otù putara Jakin, nke-orú-na-abua putara Gamul;
18 nke-orú-na-atọ putara Delaia, nke-orú-na-anọ putara Maazia.
19 Ndia bu ihe-nlekọta-ha ifè òfùfè-ha, ibà n'ulo Jehova, dika ikpé-ha si di site n'aka Eron nna-ha, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere ya iwu.
20 Ma nke umu Livai ndi fọduru: nke umu Amram, Shubael; nke umu Shubael, Jehdeia.
21 Nke Rehabia: nke umu Rehabia, onye-isi bu Ishia.
22 Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat.
23 Umu-ndikom Hebron kwa; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ.
24 Umu-ndikom Uziel, Maika; nke umu-ndikom Maika, Shamia.
25 Nwa-nne Maika, Ishia: nke umu-ndikom Ishia, Zekaraia.
26 Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi: umu-ndikom Jaazia; Beno.
27 Umu-ndikom Merari; nke Jaazia, Beno, na Shoham, na Zakua, na Ibri.
28 Nke Mahli; Eleeza, onye nēnweghi umu-ndikom.
29 Nke Kish; umu-ndikom Kish, Jerahmeel.
30 Umu-ndikom Mushi kwa; Mahli, na Ida, na Jerimot. Ndia bu umu ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.
31 Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.