Joshua

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 9

O rue, mb͕e eze nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'ọnu-miri nile nke oké osimiri uku ahu na ncherita-iru Lebanon, ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, nuru ya;
2 na ha chikọtara onwe-ha, ibuso Joshua na ibuso Israel agha, n'otù ọnu.
3 Ma ndi bi na Gibeon nuru ihe nke Joshua mereri Jeriko me kwa Ai,
4 ha we were aghughọ me ihe, ọbuná ndi ahu, ha we je, me dika ndi ezìri ozi, ha we chiri akpa kara nká n'elu inyinya-ibu-ha, na karama-akpukpọ manya-vine, nke kara nká, dọwa kwa adọwa, ekezi-kwa-ra ekezi;
5 akpukpọ-ukwu kara nká, nke ab͕ara ab͕a, di kwa n'ukwu-ha, uwe kara nká di kwa n'aru ha; achicha nile nke ihe ha nēri n'uzọ kpọ-kwa-ra nku, ma kwa ebu.
6 Ha we jekuru Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū na Gilgal, si ya, si kwa ndikom Israel, Ala di anya ka ayi si bia: ma ub͕u a ka ayi na unu b͕a ndu.
7 Ndikom Israel we si ndi-Haivait, Eleghi anya n'etiti ayi ka unu onwe-unu nēbi; àyi na unu gēsi kwa aṅa b͕a ndu?
8 Ha we si Joshua, Ndi-orù-gi ka ayi bu. Joshua we si ha, Òle ndi ka unu bu? òle ebe unu si bia kwa?
9 Ha we si ya, Ala di anya nke-uku ka ndi-orù-gi si bia n'ihi aha Jehova, bú Chineke-gi: n'ihi na ayi anuwo akukọ- Ya, na ihe nile O mere n'Ijipt,
10 na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n'ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n'Ashtarot.
11 Ndi-okenye-ayi na ndi nile bi n'ala-ayi we gwa ayi okwu, si, Werenu ihe unu gēri n'uzọ n'aka-unu, je izute ha, si ha, Ndi-orù-unu ka ayi bu: ma ub͕u a, ka ayi na unu b͕a ndu.
12 Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n'ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n'uzọ n'ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu:
13 karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n'ije di ogologo nke-uku.
14 Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n'ọnu Jehova.
15 Joshua we me ka udo di n'etiti ha na Israel, ya na ha we b͕a ndu, ka ọ kwe ka ha di ndu: ndi-isi nzukọ Israel we ṅuara ha iyi.
16 O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ mb͕e ha na ha b͕asiri ndu, na ha nuru na ndi-ab͕ata-obi-ha ka ha bu, na ọ bu kwa n'etiti ha ka ndi ahu nēbi.
17 Umu Israel we bilie ije, biarue obodo nile ha n'ubọchi nke-atọ. Ma obodo-ha bu Gibeon, na Kefira, na Beirot, na Kiriat-jearim.
18 Ma umu Israel etib͕ughi ha, n'ihí na ndi-isi nzukọ Israel ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi. Nzukọ ahu nile we tamu ntamu megide ndi-isi.
19 Ndi-isi nile we si nzukọ ahu nile, Ayi onwe-ayi ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi: ma ub͕u a ayi apughi imetu ha aka.
20 Nka ka ayi gēme ha, kwe kwa ka ha di ndu; ka iwe we ghara idikwasi ayi, n'ihi iyi ahu nke ayi ṅuru ha.
21 Ndi-isi we si ha, Ka ha di ndu: ha we ghọrọ nzukọ Israel nile ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri; dika ndi-isi gwara ha okwu.
22 Joshua we kpọ ha, gwa ha okwu, si, N'ìhi gini ka unu ghọb͕uru-ayi, si, Ndi bi n'ebe dipuru unu anya nke-uku ka ayi bu; ma unu onwe-unu nēbi n'etiti ayi?
23 Ma ub͕u a, ndi anābu ọnu ka unu bu, agaghi-ebipu kwa n'etiti unu ndi gābu orù, ma ndi-ọwa-nkú ma ndi-ose-miri bayere ulo Chinekem.
24 Ha we za Joshua, si, N'ihi na egosiri ndi-orù-gi n'ezie na Jehova, bú Chineke-gi, nyere Moses, bú orù-Ya, iwu inye unu ala nka nile, na ikpochapu ndi nile bi n'ala nka n'iru unu; ayi we tua egwu nke-uku bayere ndu-ayi n'ihi unu, ayi we me ihe a.
25 Ma ub͕u a, le, ayi nọ n'aka-gi: dika o si di nma, dika o si zi kwa ezi n'anya-gi ime ayi, me.
26 O we me ha otú a, naputa ha n'aka umu Israel, ha eb͕ughi kwa ha.
27 Joshua we me ha n'ubọchi ahu ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri bayere nzukọ Israel, baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà Jehova, rue ta, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa.