Joshua

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 6

(Ma Jeriko mechiri ọnu-uzọ-ama-ya, ewe mechibido ya uzọ n'ihi umu Israel: ọ dighi onye nāpu n'èzí, ọ dighi kwa onye nābà nime.)
2 Jehova we si Joshua, Le, enyewom Jeriko, na eze-ya, na ndi-dike nile, bú dinkpà, n'aka-gi.
3 Unu gāb͕a obodo ahu buruburu, ndikom agha nile, nēje obodo ahu buruburu otù ub͕ò. Otú a ka i gēme ubọchi isi.
4 Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e ahu: ma n'ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu.
5 Ọ gēru kwa, mb͕e ha gēwere mpi oké uda fù ọfufu-opì di anya, mb͕e unu gānu kwa olu opì-ike ahu, na ndi nkem nile gēti oké nkpu; mb͕idi obodo ahu gāda kwa n'okpuru ya, ndim gārigo kwa, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya.
6 Joshua nwa Nun we kpọ ndi-nchu-àjà, si ha, Būrunu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, ndi-nchu-àjà asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e Jehova.
7 Ha we si ndi Israel, Gabiganu, b͕a obodo ahu buruburu, ndi ejikere gāgabiga kwa n'iru ib͕e Jehova.
8 O rue, mb͕e Joshua gwara ndi Israel okwu, ndi-nchu-àjà asa ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru Jehova we gabiga, we nāfù opì-ike asa ahu: ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we nējeso ha n'azu.
9 Ndi ejikere we nēje n'iru ndi-nchu-àjà ndi nāfù opì-ike asa ahu, ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e ahu n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.
10 Joshua we nye ndi Israel iwu, si, Unu etila nkpu, unu ekwe-kwa-la ka anu olu-unu, okwu ọ bula agaghi-esi kwa n'ọnu-unu puta, rue ubọchi m'gāsi unu, Tienu nkpu; unu ewe tie nkpu.
11 Ọ we me ka ib͕e Jehova b͕a obodo ahu buruburu, nēje ya buruburu otù ub͕ò: ha we bata n'ọmuma-ulo-ikwū, nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū.
12 Joshua we bilie n'isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova.
13 Ndi-nchu-àjà asa ahu ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru ib͕e Jehova nējegide, nāfù kwa opì-ike asa ahu: ndi ejikere nēje kwa n'iru ha; ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e Jehova n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.
14 N'ubọchi nke-abua ha we b͕a obodo ahu buruburu otù ub͕ò, we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū: otú a ka ha mere ubọchi isi.
15 O rue n'ubọchi nke-asa, na ha biliri n'isi-ututu mb͕e chi nābọ, we b͕a obodo ahu buruburu n'otù uzọ ahu ub͕ò asa: nání, n'ubọchi ahu ha b͕ara obodo ahu buruburu ub͕ò asa.
16 O rue, n'ub͕ò nke-asa, mb͕e ndi-nchu-àjà fùru opì-ike asa ahu, na Joshua siri ndi Israel, Tienu nkpu; n'ihi na Jehova enyewo unu obodo ahu.
17 Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n'ulo, n'ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara.
18 Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru.
19 Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova.
20 Ndi Israel we tie nkpu, ndi-nchu-àjà we fùa opì-ike asa ahu: o rue, mb͕e ndi Israel nuru olu opì-ike, na ndi Israel tiri oké nkpu, mb͕idi ahu we da n'okpuru ya, ndi Israel we rigo n'obodo ahu, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya, ha we were obodo ahu.
21 Ha we were ọnu mma-agha wezuga ihe nile di n'obodo ahu ka ebibie ya, ma nwoke ma nwayi, ma nwata ma okenye, na ehi, na aturu, na inyinya-ibu.
22 Joshua we si ndikom abua ahu ndi nēledori ala ahu, Banu n'ulo nwayi ahu nākwa iko, menu ka nwanyi ahu na ihe nile o nwere puta, dika unu ṅuru ya iyi.
23 Umu-okorọbia ahu, bú ndi-nledo, we ba nime, me ka Rehab, na nna-ya, na nne-ya, na umu-nne-ya, na ihe nile ọ nwere, puta, ab͕uru-ya nile ka ha me-kwa-ra ka ha puta; ha we me ka ha nọdu n'azu ọmuma-ulo-ikwū Israel.
24 Ha we sure obodo ahu n'ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n'ulo-àkù Jehova.
25 Ma Joshua mere ka Rehab, bú nwayi nākwa iko, na ulo nna-ya, na ihe nile ọ nwere, di ndu; ọ we biri n'etiti Israel, rue ta; n'ihi na o zobere ndi-ozi ahu, ndi Joshua zigara iledo Jeriko.
26 Joshua we b͕a ha iyi na mb͕e ahu, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu n'iru Jehova, nke gēbili wue obodo Jeriko a: ọkpara-ya ka ọ gēwere tọ ntọ-ala-ya, nwa-nwoke-ya nke-ntà ka ọ gēwere kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ.
27 Jehova we nọyere Joshua: akukọ-ya we di n'ala ahu nile.