Udo


  • Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ.
    Jenesis 15:15
  • Jehova gēnye ndi-Ya ike; Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya.
    Abù Ọma 29:11
  • Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; Nāchọsi udo ike, b͕aso kwa ya.
    Abù Ọma 34:14
  • Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.
    Abù Ọma 37:11
  • Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo.
    Abù Ọma 37:37
  • Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere; Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere.
    Abù Ọma 119:165
  • Mu onwem bu onye-udo: Ma mb͕e m'nēkwu okwu, ndi ahu nāchọ ibu agha.
    Abù Ọma 120:7
  • Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.
    Ilu 16:7
  • mb͕e ihu n'anya, na mb͕e ikpọ asì; mb͕e agha, na mb͕e udo.
    Eklisiastis 3:8
  • N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.
    Aisaia 9:6
  • I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.
    Aisaia 26:3
  • Ihe ezi omume ahu gāluputa bu udo; ihe nke gēsi n'òfùfè ezi omume ahu puta bu kwa inọ-jū na ntukwasi-obi rue mb͕e ebighi-ebi.
    Aisaia 32:17
  • Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.
    Aisaia 54:13
  • N'ihi na ọṅù ka unu gēji puta, udo ka agēji kwa duru unu: ugwu nile na ugwu ntà nile gētiwa nkpu ọṅù, n'iru unu, osisi nile nke ọhia gāku kwa aka-ha.
    Aisaia 55:12
  • Ọ dighi udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chinekem siri.
    Aisaia 57:21
  • Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n'uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo.
    Aisaia 59:8
  • Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.
    Jeremaia 6:14
  • N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.
    Jeremaia 29:11
  • Le, M'gaje ime ka anu-aru ọhu puchie n'aru ya, ya na ngwọta, M'gāgwọta kwa ha; M'gēkpughe-kwa-ra ha nbabiga-ókè nke udo na ezi-okwu.
    Jeremaia 33:6
  • Nkpà abiawo; ha gāchọ kwa udo, ma ọ dighi.
    Ezikiel 7:25
  • bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
    Ezikiel 13:16
  • Ọ gēsite kwa n'ezi uche-ya me ka aghughọ ga nke-ọma n'aka-ya; ọ bu kwa n'obi-ya ka ọ gēme onwe-ya uku; ọ bu kwa na mb͕e udo-ha ka ọ gēbibi ọtutu madu: ọ bu kwa imegide onye-isi nke ndi-isi ka ọ gēguzo; ma agāb͕aji ya nējighi aka.
    Daniel 8:25
  • Na mb͕e udo na imegide ebe nile di urù nke ala anāchi achi ka ọ gābia; ọ gēme kwa ihe nke nna-ya-hà na ndi bu nna nna-ya-hà nēmeghi; ihe-nluta-n'agha na ihe-nkwata na àkù ka ọ gēkesara ha: ọ bu kwa imegide ebe di iche iche ewusiri ike ka ọ gēchè èchìchè-ya nile, ọbuná rue mb͕e akara àkà.
    Daniel 11:24
  • Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.
    Nehum 1:15
  • Ọgbugha-ndum diyere ya, bú ndu na udo; M'we nye ya ha dika ihe-egwu, o we tua egwum, ọ bu kwa aham ka ya onwe-ya turu ujọ ya.
    Malakai 2:5
  • Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke.
    Matiu 5:9
  • Ọ buru kwa na ulo ahu kwesiri, ka udo-unu biakwasi ya: ma ọ buru na o kwesighi, ka udo-unu laghachikute unu ọzọ.
    Matiu 10:13
  • Unu echèla na abiaram itubà udó n'elu uwa: abiaghm itubà udó, kama ọ bu mma-agha.
    Matiu 10:34
  • O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di.
    Mak 4:39
  • Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.
    Mak 5:34
  • Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.
    Mak 9:50
  • Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo.
    Luk 1:79
  • Otuto diri Chineke n'ebe kachasi ihe nile elu, Udo di kwa n'elu uwa n'etiti madu ndi ihe-ha di Ya ezi nma.
    Luk 2:14
  • O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.
    Luk 7:50
  • Ma ulo ọ bula unu gābà nime ya, burunu uzọ si, Udo diri ulo a.
    Luk 10:5
  • Ma ọ buru na ọ pughi, mb͕e onye ahu nọ n'ebe di anya ub͕u a, o ziga ndi-ozi, riọ ihe gēweta udo.
    Luk 14:32
  • si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu.
    Luk 19:38
  • Ma mb͕e ha nēkwu ihe ndia, Ya onwe-ya guzoro n'etiti ha, si ha, Udo diri uno.
    Luk 24:36
  • Udo ka M'rapuru unu; udo nkem ka M'nēnye unu: ọ bughi dika uwa nēnye ka Mu onwem nēnye unu. Ka obi-unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ.
    Jọn 14:27
  • Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.
    Jọn 16:33
  • Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n'anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia.
    Ndi Rom 1:7
  • Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha; Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa: Egwù Chineke adighi n'anya-ha.
    Ndi Rom 3:16-18
  • Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe, ayi na Chineke di n'udo site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;
    Ndi Rom 5:1
  • N'ihi na itukwasi uche n'anu-aru bu ọnwu; ma itukwasi uche na Mọ Nsọ bu ndu na udo:
    Ndi Rom 8:6
  • ma hà gēsi aṅa kwusa, ma ọ buru na ezigaghi ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ka ha si ma nma nke-uku, bú ukwu ndi nēzisa ozi ọma nke ezi ihe!
    Ndi Rom 10:15
  • Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo.
    Ndi Rom 12:18
  • n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.
    Ndi Rom 14:17
  • Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.
    Ndi Rom 14:19
  • Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.
    Ndi Rom 15:13
  • Ma ka Chineke nke udo nọyere unu nile. Amen.
    Ndi Rom 15:33
  • Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
    I. Ndi Kọrint 1:3
  • Ma ọ buru na onye ahu nke nēkweghi ekwe ekewapu onwe-ya, ya kewapu onwe-ya: emeghi ka nwa-nna-ayi nwoke ma-ọbu nwa-nna-ayi nwanyi buru orù n'okwu di otú a: ma Chineke akpọwo ayi n'udo.
    I. Ndi Kọrint 7:15
  • n'ihi na Chineke abughi Chineke nke aghara, kama Ọ bu Chineke nke udo; otú ọ di nime nzukọ nile nke ndi nsọ.
    I. Ndi Kọrint 14:33
  • Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.
    II. Ndi Kọrint 13:11
  • Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
    Ndi Galetia 1:3
  • Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,
    Ndi Galetia 5:22
  • Ka ha ra kwa, bú ndi gāgazi dika ihe-ọtùtù a si di, udo dikwasi ha, ya na ebere, dikwasi kwa Israel nke Chineke.
    Ndi Galetia 6:16
  • N'ihi na Ya onwe-ya bu udo-ayi, Onye mere ihe abua ahu ka ha buru otù ihe, Onye kwada-kwa-ra mb͕idi etiti nke ngige, ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n'iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di;
    Ndi Efesọs 2:14,15
  • nānu ọku n'obi idebe idi-n'otù nke Mọ Nsọ nime ihe-ọkiké nke bu udo.
    Ndi Efesọs 4:3
  • were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu;
    Ndi Efesọs 6:15
  • Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n'arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu.
    Ndi Filipai 4:9
  • ka O we site kwa n'aka-Ya me ka Ya onwe-ya na ihe nile di n'otù, ebe O sitesiri n'ọbara nke obe-Ya me ka Ya onwe-ya na madu di n'udo; site n'aka-Ya, ka m'kwuru, ma ọ bu ihe di n'elu uwa, ma-ọbu ihe di n'elu-igwe.
    Ndi Kọlọsi 1:20
  • Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n'obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n'otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele.
    Ndi Kọlọsi 3:15
  • Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.
    I. Ndi Tesalọnaika 5:3
  • Ma nāju iju-ajuju nzuzu na nke amaghi-ihe, ebe i matara na ha nāmuputa ilu-ọ̀gù.
    II. Timọti 2:22
  • Nāb͕asonu udo n'ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nweghi ya:
    Ndi-Hibru 12:14
  • Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus,
    Ndi-Hibru 13:20
  • Ma ọ bu nkpuru nke ezi omume ka ndi nēme udo nāgha n'udo.
    Jemes 3:18
  • Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe; Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.
    I. Pita 3:11
  • Inyinya ọzọ we puta, bú inyinya nke nācha ọku ọku: ewe nye onye nānọkwasi ya ike inapu udo n'uwa, ya na ka ha we b͕urita onwe-ha: ewe nye ya oké mma-agha.
    Nkpugh 6:4