Daalụ


  • Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya; Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.
    I. Ihe Emere 16:8
  • Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
    I. Ihe Emere 16:34
  • Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.
    I. Ihe Emere 16:35
  • Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ; We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:Ime ka ege nti olu ekele, Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.
    Abù Ọma 26:6-7
  • Ọbu ezi ihe ikele Jehova ekele, Na ibùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu: Igosi ebere-Gi n'ututu, Igosi kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi kwa-abali,
    Abù Ọma 92:1, 2
  • Ka ayi were ekele bia n'iru Ya, Ka ayi were abù ọma tikusie Ya nkpu ọṅù ike.
    Abù Ọma 95:2
  • Werenu ekele ba n'ọnu-uzọ-ama-Ya nile, Werenu otuto ba n'ogige-Ya nile: Kelenu Ya, gọzi-kwa-nu aha-Ya.
    Abù Ọma 100:4
  • Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele, Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.
    Abù Ọma 107:22
  • Werenu ekele za Jehova, Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:
    Abù Ọma 147:7
  • Werenu ekele za Jehova, Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:
    Jeremaia 30:19
  • Gi, Chineke nke nnam-hà, ka mu onwem nēkele, nāja kwa, n'ihi na amam-ihe na idi-ike ka I nyeworom, ub͕u a ka I mewo-kwa-ra ka m'mara ihe ayi riọrọ n'aka Gi: n'ihi na okwu eze ka I meworo ka ayi mara.
    Daniel 2:23
  • sure-kwa-nu àjà-ekele dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ site n'achicha ekoro eko, kpọsa-kwa-nu onyinye-afọ-ofufo di iche iche, me ka anuru ihe bayere ha: n'ihi na ihe di otú a ka unu huworo n'anya, umu Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
    Amos 4:5
  • sure-kwa-nu àjà-ekele dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ site n'achicha ekoro eko, kpọsa-kwa-nu onyinye-afọ-ofufo di iche iche, me ka anuru ihe bayere ha: n'ihi na ihe di otú a ka unu huworo n'anya, umu Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
    Jona 2:9
  • Anamekelere unu Chinekem mb͕e nile, n'ihi amara nke Chineke nke enyere unu nime Kraist Jisus;
    I. Ndi Kọrint 1:4
  • N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke.
    II. Ndi Kọrint 4:15
  • dika ndi ihe nēwuta, ma ayi nāṅuri ọṅu mb͕e nile; dika ndi-ob͕eye, ma ayi nēme ka ọtutu madu buru ọgaranya; dika ndi nēnweghi ihe, ma ayi nēnwezu ihe nile.
    II. Ndi Kọrint 6:10
  • ebe anēme ka unu buru ọgaranya n'ihe nile ọ bula rue afọ-ofufo nile, nke sitere n'aka-ayi nāluputa ekele anēkele Chineke.
    II. Ndi Kọrint 9:11
  • ma-ọbu ihe-ihere, ma-ọbu ikwu-okwu-nzuzu, ma-ọbu okwu nābaghi n'ihe, nke nēkwesigh: ma kama nke ahu ikele-ekele.
    Ndi Efesọs 5:4
  • nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi; nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;
    Ndi Efesọs 5:19, 20
  • Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ.
    Ndi Filipai 4:6
  • Ọ bughi na anamekwu okwu bayere nkpà: n'ihi na mu onwem mutara, n'ọnọdu ọ bula m'nọ, inwezu nime ya ihe nile nākpam nkpà.
    Ndi Filipai 4:11
  • buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.
    Ndi Kọlọsi 2:7
  • Nānọgidesinu ike n'ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n'ikele-ekele;
    Ndi Kọlọsi 4:2
  • nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ.
    I. Ndi Tesalọnaika 5:18
  • N'ihi na ihe nile ọ bula Chineke kère di nna, ọ dighi kwa ihe ọ bula agāju, ma ọ buru na ewere ekele nara ya:
    I. Timọti 4:4
  • Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.
    Ndi-Hibru 13:15
  • si, Amen: Ngọzi nile, na otuto nile, na amam-ihe nile, na ekele nile, na nsọpuru nile, na ike nile, na ume nile, diri Chineke-ayi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
    Nkpugh 7:12
  • si, Ayi nēkele Gi, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Onye nādi adi, Onye di-kwa-ri; n'ihi na I werewo oké ike-Gi, I bukwa eze.
    Nkpugh 11:17