Ime ime


  • Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.
    Jenesis 1:27
  • Gi eb͕ula madu.
    Deuteronomi 5:17
  • Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya? Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?
    Job 31:15
  • Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu: Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.
    Abù Ọma 127:3
  • N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua: I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà. M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma. Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi, Mb͕e emerem na nzuzo, Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.
    Abù Ọma 139:13-15
  • Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè, Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru, Nke akpuru kwa-ubọchi, Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.
    Abù Ọma 139:16
  • Tutu akpua m gi n'afọ amaram gi, ọ bu kwa tutu i si n'àkpà-nwa puta ka M'doro gi nsọ; ewerewom gi nye ka gi buru onye-amuma diri mba nile.
    Jeremaia 1:5