Zuru ike ma hie ụra


  • AI gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di; I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina. Ọzọ kwa, i gāmakpu, ọ dighi kwa onye nēme ka i ma jijiji; Ọtutu madu gēme kwa ka iru-gi dajua.
    Job 11:18,19
  • Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem.
    Abù Ọma 3:5
  • N'udo ka m'gēji otù mb͕e ahu dina ala, raru ura: N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi, nēme ka m'biri na ntukwasi-obi.
    Abù Ọma 4:8
  • I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali, Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;
    Abù Ọma 91:5
  • Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.
    Abù Ọma 127:2
  • Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu: E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.
    Ilu 3:24
  • Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura.
    Eklisiastis 5:12
  • Ọ nābà n'udo; ha nēzu ike n'elu ihe-ndina-ya, onye ọ bula nke nāgazi agazi.
    Aisaia 57:2
  • Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n'ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n'ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi: mb͕e ahu ihe Jehova gātọ gi utọ; M'gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M'gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.
    Aisaia 58:13, 14
  • Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.
    I. Ndi Kọrint 10:31
  • Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke. N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya.
    Ndi-Hibru 4:9,10