Ike


  • n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.
    Deuteronomi 20:4
  • Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.
    Joshua 1:9
  • Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova.
    I. Ihe Emere 28:20
  • nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.
    II. Ihe Emere 32:8
  • O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n'ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n'ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.
    Nehemiah 8:10
  • I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike, N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi, Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.
    Abù Ọma 8:2
  • N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe; Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi. Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.
    Abù Ọma 18:29, 30, 32
  • Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.
    Abù Ọma 20:7
  • Jehova, n'ike-Gi ka eze nāṅuri ọṅu; Le kwa otú ọ nēteghari egwú ọṅù nke-uku na nzọputa-Gi!
    Abù Ọma 21:1
  • M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma Jehova N'ala ndi di ndu? Nēle anya Jehova: Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume; E, nēle anya Jehova.
    Abù Ọma 27:13, 14
  • Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya. Jehova buru ya ike, Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu.
    Abù Ọma 28:7, 8
  • Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.
    Abù Ọma 34:18
  • Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya: Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.
    Abù Ọma 34:22
  • Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike; Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ. Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya: N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.
    Abù Ọma 37:23, 24
  • Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia: Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.
    Abù Ọma 37:39
  • Chineke, I zíwom ihe site na nwata; Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m'nēgosi oké ọlu-Gi nile. Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.
    Abù Ọma 71:17, 18
  • Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ, I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ, Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ. Me ka idi-ukum bakari uba, Gi chighari kwa kasiem obi.
    Abù Ọma 71:20, 21
  • Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.
    Abù Ọma 73:26
  • Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi; Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n'obi. Ha nēsi n'ike jerue ike, Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion.
    Abù Ọma 84:5, 7
  • Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem, Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.
    Abù Ọma 94:19
  • Ikem na abù ọmam ka Ja bu: Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.
    Abù Ọma 118:14
  • Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú: Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike.
    Abù Ọma 119:28
  • Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam: Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu.
    Abù Ọma 119:50
  • Ọ buru na ejeghariam n'etiti ahuhu, I gēme ka m'di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom, Aka-nri-Gi gāzọputakwam.
    Abù Ọma 138:7
  • Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm. N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu.
    Abù Ọma 142:3
  • N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.
    Aisaia 25:4
  • Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.
    Aisaia 40:29
  • ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida mbà.
    Aisaia 40:31
  • atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.
    Aisaia 41:10
  • Ndi ewedara n'ala na umu-ob͕eye nāchọ miri ma ọ dighi nke dinu, ire-ha kpọsiri nku n'ihi akpiri kpọrọ nku; Mu onwem, bú Jehova, gāza ha, Mu, bú Chineke Israel, M'gaghi-arapu ha.
    Aisaia 41:17
  • idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.
    Aisaia 61:3
  • N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ji si otú a, N'ihi unu nēkwu okwu a, le, anameme okwum nke di n'ọnu-gi ka ha ghọ ọku, anameme kwa ka ndi ghọ nkú, ọ gērichapu kwa ha.
    Jeremaia 5:14
  • N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru.
    Abù-Ákwá 3:31-33
  • M'gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n'aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
    Zekaraia 10:12
  • N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ nke Nna-unu Nke nēkwu nime unu.
    Matiu 10:20
  • Ma Jisus lere ha anya, si ha, N'ebe madu nọ nka bu ihe anāpughi ime; ma apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ.
    Matiu 19:26
  • Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.
    Ọlu Ndi-Ozi 1:8
  • Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori.
    Ọlu Ndi-Ozi 4:13
  • Ma ayi matara na ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n'anya ezi ihe, bú ndi akpọrọ dika ihe O nēzube si di.
    Ndi Rom 8:28
  • Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?
    Ndi Rom 8:31
  • N'ihi na okwu nke obe buru ndi nāla n'iyì ihe-nzuzu; ma ọ buru ayi, bú ndi anāzọputa, ike nke Chineke.
    I. Ndi Kọrint 1:18
  • Okwum na ihe m'kwusara abughi kwa n'okwu amam-ihe, ime ka madu kweye, kama ha bu na ngosi nke Mọ Nsọ na nke ike: ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke.
    I. Ndi Kọrint 2:4, 5
  • Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.
    I. Ndi Kọrint 16:13
  • ọ bughi na ayi ruru n'onwe-ayi, igu ihe ọ bula dika o sitere n'onwe-ayi; kama iru-eru-ayi sitere na Chineke;
    II. Ndi Kọrint 3:5
  • (n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike);
    II. Ndi Kọrint 10:4
  • Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem. N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.
    II. Ndi Kọrint 12:9, 10
  • ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n'aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu;
    Ndi Efesọs 3:16
  • Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.
    Ndi Efesọs 6:10
  • ebe m'tukwasiworo obim n'otù ihe nka, na Onye malitere ilu ezi ọlu nime unu gāluzu ya rue ubọchi Jisus Kraist:
    Ndi Filipai 1:6
  • Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.
    Ndi Filipai 4:13
  • N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.
    II. Timọti 1:7
  • asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi:
    II. Timọti 2:12
  • Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku.
    I. Jọn 4:4