Obi ụtọ


  • O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n'ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n'ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.
    Nehemiah 8:10
  • Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria, Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò: Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi.
    Abù Ọma 5:11
  • I gēme ka m'mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi; E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.
    Abù Ọma 16:11
  • N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi: I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi.
    Abù Ọma 21:6
  • N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya; Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ: N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali, Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.
    Abù Ọma 30:5
  • Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.
    Abù Ọma 126:5
  • Ọburu na Jehova ewughi ulo, N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya: Ọ buru na Jehova echeghi obodo, N'efu ka onye-nche muruworo anya. Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.
    Abù Ọma 128:1, 2
  • ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.
    Aisaia 35:10
  • Ihe ndia ka M'gwaworo unu, ka ọṅùm we di nime unu, ka ọṅù-unu we zu kwa.
    Jọn 15:11
  • n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.
    Ndi Rom 14:17