Okike-Evolution


  • Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.
    Jenesis 1:1
  • Chineke we si, Ka miri nuputa ihe nēnuputa enuputa, bú anu nwere nkpuru-obi di ndu, ka anu-ufe feghari kwa n'elu uwa n'iru mbara elu-igwe.
    Jenesis 1:20
  • Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.
    Jenesis 1:21
  • Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a.
    Jenesis 1:24
  • Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa.
    Jenesis 1:26
  • Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha.
    Jenesis 1:27
  • Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.
    Jenesis 2:7
  • n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.
    Ọpupu 20:11
  • Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe, Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi: Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe; Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi. Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile, Na aka Jehova emewo nka?
    Job 12:7-9
  • Chineke nēji olu-Ya ma éb͕è-elu-igwe n'uzọ di ebube; Ọ nēme ihe uku, ma ayi amaghi ha.
    Job 37:5
  • Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi. Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya. Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya. Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.
    Job 40:15-18
  • Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha: Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.
    Abù Ọma 89:12
  • Tutu amuputa ugwu, Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi, Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke.
    Abù Ọma 90:2
  • I nēzipu Mọ-Gi, ekè ha; I we me ka iru ala di ọhu.
    Abù Ọma 104:30
  • Ka ha to aha Jehova: N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.
    Abù Ọma 148:5
  • Otú a ka Chineke, bú Jehova, siri, bú Onye kèworo elu-igwe, seti kwa ha; Onye meworo uwa na ihe nile nke si nime ya aputa ka ọ sa mbara; Onye nēnye ndi bi n'elu ya ume ha nēku, Onye nēnye kwa ndi nējeghari nime ya mọ:
    Aisaia 42:5
  • Abum Onye nākpu ìhè na Onye nēkè ọchichiri; abum Onye nēme udo na Onye nēkè ihe ọjọ: Mu onwem bu Jehova, Onye nēme ihe ndia nile.
    Aisaia 45:7
  • Mu onwem emewo uwa, kè kwa madu n'elu ya: Mu onwem, akam abua setiri elu-igwe, ọ bu usu nile nke ihe-ha M'nyeworo iwu.
    Aisaia 45:12
  • N'ihi na otú a ka Jehova Nke kèworo elu-igwe siri; Ya onwe-ya bu Chineke: Onye kpuworo uwa, me ya; Ya onwe-ya mere ka o guzosie ike, ọ bughi ihe tọb͕ọrọ n'efu ka Ọ kère ya, ọ bu ka ewe biri nime ya ka Ọ kpuru ya: Mu onwem bu Jehova; ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.
    Aisaia 45:18
  • N'ihi na, le, M'gaje ikè elu-igwe ọhu na uwa ọhu: agaghi-echeta kwa ihe mbu nile, ha agaghi-abata kwa n'obi.
    Aisaia 65:17
  • Ọ̀ bughi otù Nna ka ayi nile nwere? ọ̀ bughi otù Chineke keworo ayi? gini mere ayi nāghọḅu, onye ọ bula ọ ghọḅu ibe-ya, nēme ka ọḅuḅa-ndu nna-ayi-hà ghara idi nsọ?
    Malakai 2:10
  • Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha.
    Mak 10:6
  • N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.
    Mak 13:19
  • Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya.
    Jọn 1:3
  • N'ihi na ihe-Ya anya nāhughi site n'òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n'ihe nile ekère èkè, bú ike ebighi-ebi Ya na udi-Chineke-Ya; ka ha ghara inwe ngọpu: n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri 2 Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu, we were ebube nke Chineke anāpughi imebi b͕anwere oyiyi nke onyinyo madu apuru imebi, na nke anu-ufe na anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu di iche iche. N'ihi ya Chineke rara ha nye n'aka adighi-ọcha n'ihe ọjọ nile nāgu obi-ha, ka ewe me aru-ha ihe-ihere n'etiti ha: ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen.
    Ndi Rom 1:20-25
  • N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike. N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya; n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke. N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a.
    Ndi Rom 8:19-22
  • n'ihi na ekèghi kwa nwoke n'ihi nwanyi; kama ekère nwanyi n'ihi nwoke:
    I. Ndi Kọrint 11:9
  • N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.
    Ndi Efesọs 2:10
  • n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile;
    Ndi Kọlọsi 1:16
  • Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:
    Ndi Kọlọsi 2:8
  • yikwasi kwa madu ọhu ahu, nke anēme ya ka ọ di ọhu rue na nmazu dika onyinyo nke Onye kère ya si di:
    Ndi Kọlọsi 3:10
  • ndi nēb͕ochi madu ilu di na nwunye, ndi si kwa madu erila ihe-oriri di iche iche, nke Chineke kère ka ndi kwere ekwe, ndi mazu-kwa-ra ezi-okwu, ka ndi ahu were ekele nara.
    I. Timọti 4:3
  • Ọzọ kwa, Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:
    Ndi-Hibru 1:10
  • Ma okwukwe bu ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwaputa nke ihe anāhughi anya. N'ihi na nime okwukwe ahu ka ab͕ara ndi okenye àmà. Okwukwe ka ayi ji ghọta na ewerewo okwu Chineke dozie uwa nile, ya mere esiteghi n'ihe putaworo ìhè kpu ihe ahu anāhu anya.
    Ndi-Hibru 11:1-3
  • ebe unu buru uzọ mara nka, na ndi-ọchìe gēji ichì-ọchì bia na mb͕e ikpe-azu, nāga dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di, nāsi kwa, Òle ebe nkwa nke ọbibia-Ya di? n'ihi na site n'ubọchi nna-ayi-hà dara n'ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site na nmalite nke òkìkè. N'ihi na nka mere ha nchefu n'ihi na ha nāchọ ya, na elu-igwe di site na mb͕e ochie, ha na ala nke esitere na miri were kwa miri me ka o guzokọ n'otù, site n'okwu Chineke; nke esitere n'aka-ha me ka uwa nke di n'oge ahu la n'iyì, n'ihi na iju-miri rikpuru ya:
    2 Peter 3:3-6
  • Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:
    Nkpugh 3:14
  • Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n'ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n'ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.
    Nkpugh 4:11
  • we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:
    Nkpugh 10:6
  • M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula; ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.
    Nkpugh 14:6-7