Na-ezu ike n'ime Onyenwe anyị


  • Ọ si, Irum ganēje, M'gēme kwa ka i zuru ike.
    Ọpupu 33:14
  • Ka ha onwe-ha nārida na nsọtu obodo, Samuel we si Sọl, Si nwa-okorọbia-gi gabiga n'iru ayi, (ọ we gabiga,) ma gi onwe-gi guzogide ub͕u a, ka m'we me ka i nu okwu Chineke.
    I. Samuel 9:27
  • O we si Juda, Ka ayi wue obodo ndia, were mb͕idi, na ulo-elu, na ibo-ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ b͕a ha buruburu; ala-ayi di n'iru ayi rue ub͕u a, n'ihi na ayi achọwo Jehova, bú Chineke-ayi; ayi achọwo Ya, O we me ka ayi zuru ike buruburu. Ha we wue, ihe we gara ha nke-ọma.
    II. Ihe Emere 14:7
  • Manu jijiji, emehie-kwa-la: Sinu otú a n'obi-unu n'elu ihe-ndina-unu, we dere du. Selah
    Abù Ọma 4:4
  • Nēle anya Jehova: Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume; E, nēle anya Jehova.
    Abù Ọma 27:14
  • Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya: Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya, N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.
    Abù Ọma 37:7
  • Elesirim anya Jehova ike; Ọ we tọrọm nti-Ya n'ala, nu ntikum.
    Abù Ọma 40:1
  • Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa.
    Abù Ọma 46:10
  • Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi: Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi
    Abù Ọma 55:22
  • Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya; Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri: Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah
    Abù Ọma 62:8
  • I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.
    Aisaia 26:3
  • N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, siri, Nime nlata na izu-ike ka agāzọputa unu; n'inọ-jū na n'itukwasi-obi ka idi-ike-unu gādi: ma unu ekweghi.
    Aisaia 30:15
  • Ihe ezi omume ahu gāluputa bu udo; ihe nke gēsi n'òfùfè ezi omume ahu puta bu kwa inọ-jū na ntukwasi-obi rue mb͕e ebighi-ebi.
    Aisaia 32:17
  • ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.
    Aisaia 40:31
  • Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya. Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku miri, ọ bu kwa n'akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n'arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n'imì nkpuru.
    Jeremaia 17:7, 8
  • N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi. Unu gākpọkukwam, je kperem ekpere, M'gēge kwa unu nti. Unu gāchọsikwam ike, we chọtam, mb͕e unu ji obi nile unu achọm.
    Jeremaia 29:11-13
  • Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.
    Abù-Ákwá 3:25, 26
  • Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike. Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu. N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.
    Matiu 11:28-30
  • Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus.
    Ndi Filipai 4:7
  • Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.
    II. Timọti 1:12
  • nātukwasinu Ya ncheb͕u nile unu nēcheb͕u onwe-unu, n'ihi na ihe nile bayere unu nēmetu Ya n'obi.
    I. Pita 5:7