Ihunanya


  • Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.
    Matiu 7:12
  • Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya. Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu. Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.
    Matiu 22:37-40
  • Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.
    Matiu 25:40
  • N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.
    Jọn 3:16
  • Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya. Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n'anya n'ebe ibe-unu nọ.
    Jọn 13:34, 35
  • Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu.
    Jọn 14:15
  • Onye nwere ihe M'nyere n'iwu, nke nēdebe kwa ha, ọ bu onye ahu nāhum n'anya: onye nāhum n'anya, Nnam gāhu kwa ya n'anya, Mu onwem gāhu kwa ya n'anya, were kwa Onwem gosi ya. Judas (ọ bughi Iskariot) si Ya, Onye-nwe-ayi, Gini putaworo na I gaje iwere Onwe-gi gosi ayi, ma ọ bughi uwa? Jisus zara, si ya, Ọ buru na madu ahum n'anya, ọ gēdebe okwum: Nnam gāhu kwa ya n'anya, Ayi gābiakute kwa ya, nēme kwa ebe-obibi-Ayi n'ebe ọ nọ. Onye nādighi-ahum n'anya adighi-edebe okwum nile: okwu nke unu nānu abughi kwa nkem, kama ọ bu nke Nna Onye ziterem.
    Jọn 14:21-24
  • Ọ dighi onye ọ bula nwere ihu-n'anya kari nka uku, ka madu tọb͕ọ ndu-ya n'ihi ndi-enyì-ya.
    Jọn 15:13
  • N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche, ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.
    Ndi Rom 8:38,39
  • Ka ihu-n'anya buru ihe nke iru-abua nādighi nime ya. Nākpọnu ajọ ihe asì; nārapara ezi ihe n'aru.
    Ndi Rom 12:9
  • Ma ub͕u a ka okwukwe, olile-anya, ihu-n'anya, ihe atọ ndia, nānọgide; ma nke kachasi n'ihe ndia bu ihu-n'anya.
    I. Ndi Kọrint 13:13
  • Ka eme ihe-unu nile n'ihu-n'anya.
    I. Ndi Kọrint 16:14
  • N'ihi na edebezuwo iwu nile n'otù okwu, bú nka; Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
    Ndi Galetia 5:14
  • nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a: ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè.
    Ndi Kọlọsi 3:13,14
  • nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie:
    I. Pita 4:8
  • Nime nka ka ayi maworo ihu-n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya tọb͕ọrọ ndu-Ya n'ihi ayi: ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ itọb͕ọ ndu-ayi n'ihi umu-nna-ayi. Ma onye ọ bula nke nwere ihe uwa nka o ji biri, nke hu-kwa-ra nwa-nna-ya ka ọ nọ na nkpà, o we mechigide ya obi ebere ya, ìhunanya Chineke si aǹa digide nime ya? Umu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n'anya n'okwu, ma-ọbu n'ire; kama ka ayi nāhu n'anya n'ọlu na ezi-okwu.
    I. Jọn 3:16-18
  • Ndi m'huru n'anya, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: n'ihi na ihu-n'anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n'anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke. Onye nādighi-ahu n'anya amaghi Chineke; n'ihi na Chineke bu ihu-n'anya.
    I. Jọn 4:7,8
  • Ndi m'huru n'anya, ọ buru na Chineke huru ayi n'anya otú a, ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n'anya.
    I. Jọn 4:11
  • Ayi onwe-ayi nāhu n'anya, n'ihi na Ya onwe-ya buru uzọ hu ayi n'anya.
    I. Jọn 4:19
  • Ihe a enyere n'iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n'ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n'anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n'anya.
    I. Jọn 4:21