Okwukwe


  • Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere: Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.
    Job 13:15
  • Tukwasi Jehova obi-gi nile, Adabere-kwa-la nghọta-gi: N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.
    Ilu 3:5,6
  • N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, siri, Nime nlata na izu-ike ka agāzọputa unu; n'inọ-jū na n'itukwasi-obi ka idi-ike-unu gādi: ma unu ekweghi.
    Aisaia 30:15
  • Mb͕e ahu O meturu anya-ha aka, si, Dika okwukwe-unu si di ka emere unu.
    Matiu 9:29
  • O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime.
    Matiu 17:20
  • Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile.
    Mak 9:23
  • Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke.
    Mak 11:22
  • N'ihi na ọ dighi okwu ọ bula si Chineke n'ọnu puta nke nāgaghi-adi irè.
    Luk 1:37
  • Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n'okwukwe, ayi na Chineke di n'udo site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;
    Ndi Rom 5:1
  • Ya mere, okwukwe si n'ọnunu puta, ma ọnunu ahu sitere n'okwu Kraist.
    Ndi Rom 10:17
  • Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n'ihi na o siteghi n'okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n'okwukwe bu nmehie.
    Ndi Rom 14:23
  • tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya.
    Ndi Efesọs 6:16
  • asi na ayi ekweghi ekwe, Ya onwe-ya nānọgide n'ikwesi ntukwasi-obi; n'ihi na Ọ pughi igọnari Onwe-ya.
    II. Timọti 2:13
  • Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu: Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.
    Ndi-Hibru 10:38
  • Ma okwukwe bu ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwaputa nke ihe anāhughi anya.
    Ndi-Hibru 11:1
  • ma asi na okwukwe adighi ọ bu ihe anāpughi ime, bú ime ihe gātọ Chineke ezi utọ: n'ihi na onye nābiakute Chineke aghaghi ikwe na Ọ di, na Ọ nēgosi kwa Onwe-ya Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu.
    Ndi-Hibru 11:6
  • nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.
    Ndi-Hibru 12:2
  • Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya. Ma ya riọ n'okwukwe, ghara inwe obi abua: n'ihi na onye nwere obi abua yiri ebili-miri nke oké osimiri mb͕e ifufe nēfeghari ya, anātuli kwa ya elu. N'ihi na, ka madu ahu ghara ichè na ọ gānata ihe ọ bula n'aka Onye-nwe-ayi; ọ bu nwoke nwere uche abua, onye nādighi-eguzo n'otù ebe n'uzọ-ya nile.
    Jemes 1:5-8
  • N'ihi na dika aru bu ihe nwuru anwu ma mọ adighi ya, ọbuná otú a okwukwe bu ihe nwuru anwu ma ọlu adighi ya.
    Jemes 2:26
  • Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n'ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà, ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist: Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto: ebe unu nānata ihe okwukwe-unu gēweta, bú nzọputa nke nkpuru-obi-unu.
    I. Pita 1:6-9
  • N'ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi.
    I. Jọn 5:4