Praise


  • O we me ka ndi-ya dua ya ọdu, o we guzo ndi nābùku Jehova abù, ndi nēto kwa ima-nma nke idi-nsọ, mb͕e ha nāpu n'obodo n'iru ndi ejikere agha, si, Kelenu Jehova; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Ma na mb͕e ha malitere iti nkpu na ito otuto, Jehova tiyere ndi nēru nbì imegide umu Amon na Moab na ugwu Sia, bu ndi nābakuru Juda; ewe tib͕ue ha.
    II. Ihe Emere 20:21,22
  • O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n'ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n'ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.
    Nehemiah 8:10
  • M'gāgọzi Jehova na mb͕e nile: Mb͕e nile ka otuto-Ya gādi n'ọnum.
    Abù Ọma 34:1
  • Onye nāchu ekele dika àjà nāsọpurum; Ọ bu kwa onye nēdozi uzọ-ya Ka m'gēme ka ọ hu nzọputa Chineke.
    Abù Ọma 50:23
  • Ọnum gējuputa n'otuto-Gi, Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi.
    Abù Ọma 71:8
  • Ma mu onwem, mb͕e nile ka m'ganēche Gi, We tukwasi otuto n'otuto-gi nile
    Abù Ọma 71:14
  • Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu: Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije.
    Abù Ọma 89:15
  • Ọbu ezi ihe ikele Jehova ekele, Na ibùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu:
    Abù Ọma 92:1
  • Jehova bu eze; ka uwa tegharia egwu ọṅù; Ka ala bara uba nke di oké osimiri buruburu ṅuria.
    Abù Ọma 97:1
  • Ṅurianu na Jehova, unu ndi ezi omume; Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.
    Abù Ọma 97:12
  • Tikusienu Johova nkpu ọṅù ike, uwa nile. Werenu ọṅù fè Jehova òfùfè: Werenu iti-nkpu ọṅù bia n'iru Ya.
    Abù Ọma 100:1,2
  • Ebere na ezi ikpé ka M'gābù n'abù: Gi, Jehova, ka m'gabùku abù ọma.
    Abù Ọma 101:1
  • Gọzie Jehova, nkpuru-obim; Ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya. Gọzie Jehova, nkpuru-obim, Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya O nēmeso gi:
    Abù Ọma 103:1,2
  • Site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya Aha Jehova gābu ihe anēto eto.
    Abù Ọma 113:3
  • Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú: Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma. N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ: Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma. Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru: Ka ha tie nkpu ọṅò n'elu ihe-ndina-ha.
    Abù Ọma 149:1,3-5
  • Tonu Ja. Tonu Chineke n'ebe nsọ Ya: Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya. Tonu Ya n'ihi idi-ike-Ya nile: Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di. Werenu ọfufù opì-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya. Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya: Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya: Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya: Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya. Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja. Tonu Ja.
    Abù Ọma 150
  • Ma dika n'etiti abali Pọl na Sailas nēkpe ekpere nābùku kwa Chineke abù, ndi-nkpọrọ we nēge nti n'olu-ha;
    Ọlu Ndi-Ozi 16:25
  • nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi; nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist;
    Ndi Efesọs 5:19,20
  • nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ.
    I. Ndi Tesalọnaika 5:18
  • Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.
    Ndi-Hibru 13:15
  • Otù olu we site n'oche-eze ahu da, si, Nētonu Chineke-ayi, unu ndi-orù-Ya nile, ndi nātu egwu Ya, ndi ntà na ndi uku.
    Nkpugh 19:5