Okwu ahụ


  • N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi.
    Abù Ọma 119:11
  • Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.
    Abù Ọma 119:130
  • Ma Ọ zara, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Chineke puta.
    Matiu 4:4
  • Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.
    Matiu 24:35
  • Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke. Onye ahu na Chineke diri na mbu. Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.
    Jọn 1:1,14
  • Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu.
    Jọn 6:63
  • Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n'ihi okwu nke M'gwaworo unu.
    Jọn 15:3
  • Nānu ọku n'obi iche onwe-gi n'iru madu dika onye Chineke nwaputaworo, onye-ọlu nke ihere nāpughi ime ya, onye nēkwuzi okwu nke ezi-okwu ahu.
    II. Timọti 2:15
  • N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.
    Ndi-Hibru 4:12
  • dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa;
    I. Pita 2:2