II. Pita

1 2 3


Isi 1

Saimon Pita, orù na onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi ketaworo okwukwe di oké ọnu-ahia ra ka nke ayi ketaworo n'ezi omume Onye ahu, bú Chineke-ayi na Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist;
2 Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo, nime nmazu nke Chineke na nke Jisus Onye-nwe-ayi;
3 dika ike O ji buru Chineke nyeworo n'aka-ayi ihe nile di ndu na nsọpuru-Chineke n'efu, site na nmazu nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka Ya kpọ ayi;
4 bú nke O siteworo nye n'aka-ayi nkwa nile ahu di oké ọnu-ahia di kwa uku ri nne; ka unu we site n'ihe ndia ghọ ndi nēnwekọ ihe O ji buru Chineke, ebe unu b͕anariworo nmebi nke di n'uwa site n'agu ihe ọjọ.
5 Ma n'ihi otù ihe a n'akuku-unu tukwasinu inu-ọku-n'obi nile, nyezu-kwa-nu idi-nma n'okwukwe-unu; nyezu kwa ihe-ọmuma n'idi-nma-unu;
6 nyezu kwa ijisi-onwe-unu-ike n'ihe-ọmuma-unu; nyezu kwa ntachi-obi n'ijisi-onwe-unu-ike; nyezu kwa nsọpuru-Chineke nime ntachi-obi-unu;
7 nyezu kwa ihuunanya umu-nna nime nsọpuru-Chineke-unu; nyezu kwa ihu-n'anya nime ihu-n'anya-umu-nna-unu.
8 N'ihi na asi na unu nwere ihe ndia, asi kwa na unu nwere ha ri nne, ha nēdo unu ndi nābughi ndi nādighi-alu ọlu ma-ọbu ndi nādighi-ami nkpuru rue imazu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
9 N'ihi na onye ahu ihe ndia nādighi ya nso bu onye kpuru ìsì, onye nāhu inyoghi-inyoghi, ebe ọ chezọrọ nsachapu nke nmehie ochie ya nile.
10 N'ihi nka, umu-nnam, nānunu ọku n'obi kari ime ka ọkpukpọ-unu na nrọputa-unu buru ihe nēguzosi ike: n'ihi na asi na unu e#me ihe ndia, unu agaghi-asu ngọngọ mb͕e ọ bula ma-oli:
11 n'ihi na otú a ka agēnyezu unu n'àkù nbata ahu unu gābata nime ala-eze ebighi-ebi nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist.
12 N'ihi nka mb͕e dum agajem ichetara unu ihe ndia, ọ bu ezie na unu matara ha, emewo kwa ka unu guzosie ike n'ezi-okwu ahu nke dinyere unu.
13 Ma anamagu ya n'ihe ziri ezi, ka oge ra m'nọ n'ulo-ikwū a, ikpali unu n'ichetara unu;
14 ebe m'matara na ntupu nke ulo-ikwūm nka nābia ọsọsọ, ọbuná dika Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gosirim.
15 E, m'gānu ọku n'obi ka unu we nwe ike icheta ihe ndia n'oge nile ọ bula mb͕e m'lasiri.
16 N'ihi na ayi esoghi akukọ-irò nke eji amam-ihe kọ, mb͕e ayi mere ka unu mara ike na ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ma emere ayi ka ayi buru ndi huru idi-uku nke Onye ahu.
17 N'ihi na Ọ natara nsọpuru na ebube n'aka Chineke, bú Nna, mb͕e Ebube ahu nke kwesiri idi-uku mere ka olu di otú a dara Ya, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di Mu onwem ezi nma:
18 olu a ka ayi onwe-ayi nukwara ka o nēsi n'elu-igwe da, mb͕e ayi na Ya nọ n'ugwu ahu di nsọ.
19 Eme-kwa-ra ka okwu amuma ahu guzosiere ayi ike kari; nke unu nēme nke-ọma n'iṅa nti ya, dika oriọna mb͕e ọ nēnwu n'ebe b͕ara ọchichiri, rue mb͕e chi gābọ, kpakpando chi-ọbubọ we tibe n'obi-unu:
20 ebe unu buru uzọ mara nka, na ọ dighi amuma ọ bula n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke madu puru ikọ isi-ya site na nání uche nke aka ya.
21 N'ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.