Ndi-Hibru

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13


Isi 3

Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;
2 na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n'èzi-na-ulo-Ya dum.
3 N'ihi na aguwo Onye a n'Onye kwesiri otuto kari Moses, n'uzọ na otú ahu onye luru èzi-na-ulo nwere nsọpuru kari èzi-na-ulo-ya.
4 N'ihi na èzi-na-ulo ọ bula nwere onye luru ya; ma Onye luru ihe nile bu Chineke.
5 Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n'èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu;
6 ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.
7 N'ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,
8 Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu, Dika emere n'ubọchi ọnwunwa ahu n'ọhia,
9 Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem, Hu kwa ọlum ọgu arọ abua.
10 N'ihi nka ọnuma dim n'obi megide ọb͕ọ a, M'we si, Ha nējehie mb͕e nile n'obi-ha: Ma ndi ahu amaghi uzọm nile;
11 Dika M'ṅuru iyí n'iwe m si, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.
12 Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n'etiti unu ma eleghi anya, n'iwezuga onwe-ya n'ebe Chineke di ndu nọ:
13 kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie:
14 n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:
15 n'oge anēkwu, si, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya, Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu.
16 N'ihi na òle ndi, mb͕e ha nuru, kpasuru obi-ilu? ọ̀ bughi kwa ndi nile ndi siri n'Ijipt puta site n'aka Moses?
17 Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n'obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia?
18 Ma òle ndi ka Ọ ṅuru iyi na ha agaghi-abà n'izu-ike-Ya, ma ọ bughi ndi nēkweyeghi?
19 Ayi riba-kwa-ra ama na ha apughi ibà nime n'ihi ekweghi-ekwe.