II. Timọti

1 2 3 4


Isi 1

Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, dika nkwa nke ndu ahu nke di nime Kraist Jisus si di,
2 nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m'huru n'anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.
3 Anameleke Chineke, Onye m'nēkpere site na nnam ochie-hà n'akọ-na-uche di ọcha, otú nchetam bayere gi n'aririọm nile di n'ewepughi aka,
4 n'ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m'nēcheta anya-miri-gi nile, ka m'we juputa n'ọṅù;
5 ebe emerem ka m'cheta okwukwe iru-abua nādighi ya nke di nime gi; bú okwukwe nke buru uzọ biri nime nne-gi ochie Lois na nne-gi Yunaisi; ma emerem ka m'kweye na o bi kwa nime gi.
6 Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nēchetara gi ka i me ka onyinye-amara nke Chineke nwuru ọku, bú nke di nime gi site n'ibikwasi aka abua nkem n'isi-gi.
7 N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.
8 Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di;
9 Onye zọputara ayi, were kwa ọkpukpọ di nsọ kpọ ayi, ọ bughi dika ọlu-ayi si di, kama dika ihe Ya onwe-ya zubere, na amara-Ya, si di, nke enyere ayi nime Kraist Jisus mb͕e oge ebighi-ebi akērughi,
10 ma emere ka ọ puta ìhè ub͕u a site na ngosi nke Onye-nzọputa-ayi Kraist Jisus, Onye mere ka ọnwu ghara idi ìrè, site kwa n'ozi ọma Ya weputa ndu na emebighi-emebi n'ìhè,
11 bú ozi ọma nke edoro mu onwem ka m'buru onye-nkwusa, na onye-ozi, na onye-ozizí, izisa ya.
12 Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.
13 Jide ihe ilere anya nke okwu nēnye ezi ndu nke i nuru n'ọnum, nime okwukwe na ihunanya nke di nime Kraist Jisus.
14 Ihe ọma ahu nke enyere n'aka-gi idebe, were Mọ Nsọ Nke bi nime ayi nēche ya.
15 I matara nka, na ndi nile di n'Esia b͕akutaram azu; ndi Faigelọs na Hamọgenis di n'etiti ha.
16 Ka Onye-nwe-ayi mere èzí-na-ulo Ọnisifọrọs ebere: n'ihi na o mere ka m'nwe ume ndu ọtutu mb͕e, ihere nkpọrọm emeghi kwa ya;
17 kama, mb͕e ọ biaruru Rom, o were inu-ọku-n'obi chọbam, we chọtam
18 (ka Onye-nwe-ayi nye ya ka ọ chọta ebere n'aka Onye-nwe-ayi n'ubọchi ahu); ka ha ra kwa, bú ihe o ji jere m ozi n'Efesọs, gi onwe-gi jere karia.