I. Timọti

1 2 3 4 5 6


Isi 4

Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,
2 site n'iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n'akọ-na-uche nke aka ha;
3 ndi nēb͕ochi madu ilu di na nwunye, ndi si kwa madu erila ihe-oriri di iche iche, nke Chineke kère ka ndi kwere ekwe, ndi mazu-kwa-ra ezi-okwu, ka ndi ahu were ekele nara.
4 N'ihi na ihe nile ọ bula Chineke kère di nna, ọ dighi kwa ihe ọ bula agāju, ma ọ buru na ewere ekele nara ya:
5 n'ihi na esitere n'okwu Chineke na ekpere do ya nsọ.
6 Ọ buru na i me ka umu-nna-ayi nēchè uche n'ihe ndia, i gābu onye nējere Kraist Jisus ozi nke-ọma, ebe anāzùputa gi n'okwu nile nke okwukwe-ayi, na nke ozizí ọma ahu nke i soworo n'ukwu n'ukwu:
7 ma ju akukọ-irò nile emeruru emeru nke di-kwa-ra agadi-ndinyom. Ma nānwa onwe-gi ka i we rue nsọpuru-Chineke:
8 n'ihi na ọnwunwa nke aru bara urù nye ihe ntà; ma nsọpuru-Chineke bara urù nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndu, ma nke ndu ub͕u a, ma nke gaje ibia.
9 Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula.
10 N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.
11 Nēnye ihe ndia n'iwu, nēzí kwa ha.
12 Ekwela ka onye ọ bula lelìa nwata i bu anya; kama me onwe-gi ka i buru ndi kwere ekwe ihe-atù, n'okwu, n'ibi-obi, n'ihu-n'anya, n'okwukwe, n'idi-ọcha.
13 Rue mb͕e m'gābia, nāṅa nti ọgugu-akwukwọ-gi na idu-ọdu-gi na ozizí-gi.
14 Elefula onyinye-amara ahu nke di nime gi anya, nke esitere n'ibu-amuma, ya na ibikwasi-aka-n'isi nke ndi bu okenye, nye gi.
15 Nējisi ike n'ihe ndia; nānọsi ike nime ha; ka iga-n'iru-gi we puta ìhè n'ebe madu nile nọ.
16 Riba onwe-gi na ozizí-gi ama. Nānọgide n'ihe ndia; n'ihi na n'ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi.