Ndi Filipai

1 2 3 4


Isi 2

Ya mere ọ buru na nkasi-obi ọ bula di nime Kraist, ọ buru na ngugu-obi ọ bula nke ihu-n'anya di, ọ buru na nnwekọ ọ bula nke Mọ Nsọ di, ọ buru na obi-ebere na ime-ebere ọ bula di,
2 menu ka ọṅùm juputa, ka unu we tukwasi uche-unu n'otù ihe ahu, nwe kwa otù ihunanya ahu, nēnwekọ otù nkpuru-obi, nēnwe otù uche;
3 unu emela ihe ọ bula n'uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n'uzọ ichọ otuto efu, kama n'obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma;
4 unu nile n'otù n'otù elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n'otù n'otù le kwa ihe nke madu-ibe-unu anya.
5 Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus:
6 Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n'udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n'ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke,
7 kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n'inara udi nke orù, ewe me Ya n'oyiyi nke madu;
8 ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n'oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe.
9 N'ihi nka Chineke welikwara Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu;
10 ka ọ gābu n'aha Jisus ka ikperè nile we b͕ue n'ala, nke ihe nile di n'elu-igwe na ihe nile di n'elu uwa na ihe nile di n'okpuru ala,
11 ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke, bú Nna, otuto.
12 Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku;
13 n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma.
14 Menu ihe nile nējighi ntamu na iru-uka ọ bula;
15 ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n'etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n'etiti ha dika ndi nēnye ìhè n'uwa,
16 nēche okwu nke ndu n'iru madu; ka m'we nwe ihe inya isi nye n'ubọchi nke Kraist, na ab͕aghi m ọsọ n'efu, na adọb͕ughkwam onwem n'ọlu n'efu
17 E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:
18 n'otù uzọ ahu unu onwe-unu, ṅuri-kwa-nu ọṅu, sokwam nāṅuri ọṅu.
19 Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m'gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m'mara ọnọdu-unu.
20 N'ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n'ezie.
21 N'ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist,
22 Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma.
23 Ya mere, onye a ka m'nēle anya na m'gēziga ya n'otù oge ahu, mb͕e ọ bula m'gāhu otú ọ gādirim:
24 ma anamatukwasi obim nime Onye-nwe-ayi na mu onwem gābia kwa ọsọsọ.
25 Ma anamagu ya ihe di nkpà izigara unu Epafrọdaitọs, bú nwa nna m na onye mu na ya nālukọ ọlu, onye mu na ya nēbukọ kwa agha, onye buru kwa onye-ozi-unu na onye nēfè òfùfè ib͕o nkpàm;
26 ebe agu unu nile nāgusi ya ike, obi lọ-kwa-ra ya miri, n'ihi na unu nuru na aru-ya adighi ike:
27 n'ihi na aru-ya adighi ike n'ezie, ọ nọ kwa nso ọnwu: ma Chineke mere ya ebere; ma ọ bughi nání ya onwe-ya, kama mu onwem kwa, ka m'we ghara inwe ihe-nwuta n'elu ihe-nwuta.
28 Ya mere ọ nānukarim ọku n'obi iziga ya, ka ọ gābu, mb͕e unu huru ya ọzọ, ka unu we ṅuria ọṅu, ka mu onwem we nwe kwa ihe-nwuta nke dikariri ntà.
29 Ya mere werenu ọṅù nile nara ya nke-ọma nime Onye-nwe-ayi; nāsọpuru-kwa-nu ndi di otú a:
30 n'ihi na ọ bu n'ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n'ifè-òfùfè-unu n'ebe m'nọ.