Ndi Efesọs

1 2 3 4 5 6


Isi 2

Unu onwe-unu ka O me-kwa-ra ka unu di ndu, mb͕e, unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na nmehie nile unu,
2 nke unu jeghariri nime ha n'oge gara aga n'uzọ oge nke uwa nka, dika onye-isi nke ike nke mbara-elu-igwe si chọ, bú mọ ahu nke nālusi ọlu ike nime umu nke ekweyeghi-ekwenye ub͕u a;
3 ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n'etiti ha n'oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa:
4 ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n'ebere, n'ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi,
5 ọbuná mb͕e ayi nọ n'ọnwu site na ndahie nile ayi, O mere ka ayi so Kraist dikọ ndu (ejiwo amara zọputa unu),
6 me kwa ka ayi so Ya si n'ọnwu bilikọ, me kwa ka ayi so Ya nọdukọ n'ebe di n'elu-igwe, nime Kraist Jisus:
7 ka Ọ we gosi ihe a n'oge nile gaje ibia, bú àkù nke amara-Ya di uku ri nne, n'obi-ọma n'ebe ayi nọ nime Kraist Jisus:
8 n'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke:
9 o siteghi n'ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi.
10 N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.
11 N'ihi nka chetanu, na n'oge gara aga unu onwe-unu, bú ndi mba ọzọ n'anu-aru, ndi ha nākpọ aha Ebìghi-úgwù, bú ndi anākpọ aha Obibì-úgwù, n'anu-aru, nke eji aka me;
12 na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa.
13 Ma ub͕u a nime Kraist Jisus unu onwe-unu, bú ndi nọ n'ebe di anya n'oge gara aga, unu ka emere ka unu nọ nso nime ọbara Kraist.
14 N'ihi na Ya onwe-ya bu udo-ayi, Onye mere ihe abua ahu ka ha buru otù ihe, Onye kwada-kwa-ra mb͕idi etiti nke ngige,
15 ebe ọ bu nime anu-aru-Ya ka O mere ka iro ahu ghara idi irè, bú iwu nke bu ihe di iche iche enyere n'iwu; ka O we were madu abua ahu kè otù madu ọhu nime onwe-ya, nēme ka udo di;
16 ka O we were kwa obe-Ya me ka ha abua na Chineke di n'otù nime otù aru, ebe O b͕usiri iro ahu nime ya:
17 O we bia zì unu ndi nọ n'ebe di anya ozi ọma nke udo, zì kwa ndi nọ nso ozi ọma nke udo:
18 n'ihi na ayi abua sitere n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ.
19 Ya mere otù a unu abughi ndi-ọbìa na ndi nānọ dika ọbìa ọzọ site n'ub͕u a, kama unu soro ndi nsọ buru ndi amuru n'ala, unu bu kwa ndi èzi-na-ulo Chineke,
20 ewu-kwa-ra unu dika ulo n'elu ntọ-ala nke bu ndi-ozi na ndi-amuma, nke isi nkume nime nkuku ntọ-ala ahu bu Kraist Jisus onwe-ya;
21 ọ bu kwa nime Ya ka ulo nile ọ bula anēwu n'ulo ahu, ebe anējikọ ha nke-ọma, nāba uba we buru ulo nsọ nime Onye-nwe-ayi;
22 Onye anēwukọ kwa unu onwe-unu nime Ya ka unu we buru ebe-obibi nke Chineke nime Mọ Nsọ.