Luk

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 24

Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, n'oké isi-ututu, ha biaruru ílì ahu, nēbute uda utọ di iche iche nke ha doziri.
2 Ha we hu nkume ahu na akpọrepuwo ya n'ílì.
3 Ha we ba nime, ma ha ahughi aru nke Onye-nwe-ayi Jisus.
4 O we rue, mb͕e ha nọ n'obi abua n'ihi nka, le, ndikom abua guzoro ha nso n'uwe nēb͕u àmùmà:
5 ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n'ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n'etiti ndi nwuru anwu?
6 Ọ nọghi n'ebe a, kama emere ka O si n'ọnwu bilie: chetanu otú Ọ gwara unu okwu mb͕e Ọ nọ kwa na Galili,
7 si, na aghaghi irara Nwa nke madu nye n'aka ndikom nēmehie emehie, na aghaghi kwa ikpọgide Ya n'obe, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.
8 Ha we cheta okwu-Ya,
9 we si n'ílì ahu laghachi, kọrọ ndi-ozi iri na otù, na ndi nile fọduru, ihe ndia nile.
10 Ma ha bu Meri Magdalini, na Joana, na Meri nne Jemes: ndinyom fọduru ndi soro ha we gwa ndi-ozi-Ya ihe ndia.
11 Okwu ndia we di ka okwu efu n'anya-ha; ha ekweghi kwa ha.
12 Ma Pita biliri, b͕a ọsọ jerue ílì; o we ruru ala, nyo nime ya, we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ nání ha; o we la n'ulo-ya, ihe nke meworo nēju kwa ya anya.
13 Ma le, ubọchi ahu ndikom abua nime ha nāga otù obodo ntà, aha-ya bu Emeus, nke di ọgu mail atọ site na Jerusalem.
14 Ndi ahu nākparita kwa n'etiti onwe-ha uka bayere ihe ndia nile mereri.
15 O we rue, mb͕e ha nākparita uka nājurita kwa onwe-ha ajuju, Jisus onwe-ya we biarue nso, so kwa ha ga.
16 Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya.
17 O we si ha, Gini bu okwu ndia unu nāgwarita onwe-unu, ka unu nāga ije? Ha we guzo nāb͕aru iru.
18 Otù onye nime ha, aha-ya bu Kleopas, we za, si Ya, Ọ̀ bu nání Gi onwe-gi nọ dika ọbìa na Jerusalem nāmaghi ihe mere nime ya n'ubọchi ndia?
19 Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n'ọlu na okwu n'iru Chineke na ndi-Ju nile:
20 ya na otú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi-ayi rara Ya nye ka ama Ya ikpé ọnwu, we kpọgide Ya n'obe.
21 Ma ayi onwe-ayi lere anya na Ya onwe-ya bu onye gaje ib͕aputa Israel. E, tukwasi kwa ihe ndia nile, ta bu ubọchi nke-atọ site na mb͕e ihe ndia mere.
22 Ma ndinyom ufọdu n'etiti ayi mekwara ka ibobo nwua ayi n'aru, n'ihi na ha jere ílì-Ya n'isi-ututu;
23 mb͕e ha nāhughi aru-Ya, ha we bia, si, na ha hukwarari ọhù, bú ndi-mọ-ozi, ndi siri na Ọ di ndu.
24 Ufọdu n'etiti ndi soro ayi we je ílì ahu, hu kwa ya ọbuná otú ndinyom ahu kwuru: ma Ya onwe-ya ka ha nāhughi.
25 Ya onwe-ya we si ha, Unu ndi nēnweghi uche, ndi di kwa urè n'obi ikwere n'ihe nile ndi-amuma kwuru!
26 Ọ̀ bughi na Kraist aghaghi ihu ahuhu ndia, na ibà n'ebube-Ya?
27 O we malite isi n'akwukwọ Moses, si kwa n'akwukwọ ndi-amuma nile, me ka ha mata isi okwu bayere Onwe-ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ.
28 Ha we biarue obodo ntà ahu nso, ebe ha nāga: ma Ya onwe-ya mere dika Ọ nāga n'iru.
29 Ha we rugide Ya, si, Nọyere ayi: n'ihi na o rubewo anyasi, ubọchi agamiwo kwa ub͕u a. O we ba n'ulo inọyere ha.
30 O we rue, mb͕e Ya na ha nọdusiri na nri, na O were ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, we nēnye ha.
31 Ewe saghe anya-ha, ha we mara Ya; Ya onwe-ya we funari n'anya-ha.
32 Ha we sirita onwe-ha, Òbi-ayi ekpoghi ọku nime ayi, mb͕e Ọ nāgwa ayi okwu n'uzọ, mb͕e Ọ nēmeghere ayi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ?
33 Ha we bilie n'oge hour ahu, laghachi na Jerusalem, we hu ndi-ozi iri na otù ahu, na ndi ha na ha nọ, ka ha zukọrọ,
34 nāsi, N'ezi-okwu Onye-nwe-ayi esiwo n'ọnwu bilie, were kwa Onwe-ya gosi Saimon.
35 Ha onwe-ha we kọ ihe mere n'uzọ, na otú ha mara Ya n'inyawa ob͕e achicha ahu.
36 Ma mb͕e ha nēkwu ihe ndia, Ya onwe-ya guzoro n'etiti ha, si ha, Udo diri uno.
37 Ma ha turu ujọ, tu kwa egwu, ha we chè na ha huru mọ.
38 O we si ha, Gini mere obi nālọ unu miri? n'ìhi gini ka iru-uka nēbili kwa n'obi-unu?
39 Lenu akam na ukwum, na ọ bu Mu onwem: datunum aka, le-kwa-nu; n'ihi na mọ enweghi anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere.
40 Mb͕e O kwusiri nka, O we gosi ha aka-Ya na ukwu-Ya.
41 Ma mb͕e ha nọ nēkweghi ekwe n'ihi ọṅù, mb͕e ọ nēju kwa ha anya, Ọ si ha, Ùnu nwere ihe-oriri ọ bula n'ebe a?
42 Ha we nye Ya òkè nime azù aruru aru.
43 O we nara ya, rie n'iru ha.
44 O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem.
45 Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n'akwukwọ nsọ;
46 O we si ha, Otú a ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n'ubọchi nke-atọ;
47 na agēkwusa kwa nchèghari na nb͕aghara nmehie n'aha-Ya gwa mba nile, nāmalite site na Jerusalem.
48 Unu onwe-unu bu ndi-àmà nke ihe ndia.
49 Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n'isi-unu: ma nọdunu n'obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n'elu yikwasi unu.
50 O we dupu ha rue n'uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha.
51 O we rue, mb͕e Ọ nāgọzi ha, na Ọ kewapuru n'ebe ha nọ, ewe welie Ya la n'elu-igwe.
52 Ndi ahu we kpọ isi ala nye Ya, we ji oké ọṅù laghachi na Jerusalem:
53 ha we nānọ n'ulo uku Chineke mb͕e nile, nāgọzi Chineke.