Zefanaia

1 2 3


Isi 3

Ahuhu diri obodo nke nēnupu isi, nke ruwo-kwa-ra árú, obodo ahu nke nēme ihe-ike!
2 Ọ geghi nti olu Chineke; ọ naraghi idọ-aka-na-nti; Jehova ka ọ nātukwasighi obi; Chineke-ya ka ọ nābiakuteghi nso.
3 Ndi-isi-ya n'etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n'ututu.
4 Ndi-amuma-ya bu ndi obi-ha nādighi n'otù ebe, ndi-nghọb͕u: ndi-nchu-àjà-ya emewo ka ihe nsọ ghara idi nsọ, ha emewo iwu ihe-ike.
5 Jehova bu onye ezi omume n'etiti ya; Ọ dighi-eme ajọ omume; kwa-ututu ka Ọ nēme ka ikpé-Ya puta ìhè, ọ dighi mb͕e Ọ nādighi; ma onye ajọ omume adighi-ama ihere.
6 Ebipuwom mba di iche iche, ulo-nkuku nile ha tọb͕ọrọ n'efu; emewom ka èzí nile ha buru nkpọnkpọ-ebe, onye-ngabiga we ghara idi: emebisiwo obodo nile ha, onye ọ bula we ghara idi, ha we ghara inwe onye-obibi.
7 Asirim, N'ezie i gātu egwum, i gānara idọ-aka-na-nti; ewe ghara ibipu ebe-obibi-ya, dika ihe nile si di nke M'jiworo leta ya: ma otú ọ di, ha biliri n'isi-ututu, bibie omume nile ha.
8 N'ihi nka cherenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), cherenu ubọchi mb͕e M'gēbili ọtọ ikwata ihe: n'ihi na ikpém bu ime ka mba nile zukọta, ka M'we chikọta ala-eze nile, iwusa ha oké iwem, bú ọnuma nile nke iwem; n'ihi na agēji ọku nke ekworom ripia uwa nka nile.
9 N'ihi na mb͕e ahu ka M'gāb͕anwere ndi nile di iche iche eb͕ub͕ere-ọnu di ọcha, ka ha nile we kpọkue aha Jehova, ifè Ya n'otù ùbú.
10 Site n'ofè osimiri nile nke Etiopia ka ndi-aririọm, bú ada ndim achusara achusa, gēburu onyinye-inata-iru-ọmam.
11 N'ubọchi ahu ka ihere omume-gi nile nāgaghi-eme gi, bú nke i jiworo jehie megidem: n'ihi na mb͕e ahu ka M'gēwezuga n'etiti gi ndi-gi nāṅuri ọṅu-agha nime npakọ, i gaghi-adi kwa npako ọzọ n'ugwu nsọm.
12 M'gēme kwa ka otù ndi ewedara n'ala nke nēnweghi kwa ike fọdu n'etiti gi, ha gāb͕abà kwa n'aha Jehova.
13 Ndi Israel fọduru agaghi-eme ajọ omume, ha agaghi-ekwu kwa okwu-agha; agaghi-ahu kwa ire aghughọ n'ọnu-ha: n'ihi na ndi ahu gāzù onwe-ha makpu kwa amakpu dika aturu, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.
14 Tie nkpu ọṅù, gi ada Zaion; tie nkpu, gi Israel; ṅuria, were obi nile ṅuria ọṅu-agha, gi ada Jerusalem.
15 Jehova ewezugawo ikpé-gi nile, Ọ chughachiwo onye-iro-gi: Eze Israel, bú Jehova, nọ n'etiti gi: i gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọzọ.
16 N'ubọchi ahu ka agāsi Jerusalem, Atula egwu: gi Zaion, ekwela ka aka-gi abua kuda.
17 Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n'aru gi, Ọ gedere du n'ihu-n'anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n'aru gi.
18 Ndi ọ nēwuta n'ihi mb͕e akara àkà ka M'gēme ka ha zukọta, bú ndi sitere na gi: bú obodo nke ibu eboro ya bu ita-uta.
19 Le, M'ganēmeso ndi ahu nile, bú ndi nēweda gi n'ala, na mb͕e ahu: M'gāzọputa kwa nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi, ọ bu kwa nwanyi nke achupuru achupu ka M'gāchikọta; M'gēme kwa ka ha ghọ otuto, ghọ kwa aha, bú ndi ihere-ha di n'uwa nka nile.
20 Na mb͕e ahu ka M'gēme ka unu bata, ọ bu kwa na mb͕e ahu ka M'gāchikọta unu: n'ihi na M'gēme ka unu ghọ aha, ghọ kwa otuto n'etiti ndi nile di iche iche nke uwa, mb͕e M'gēme ka ndi-unu adọtara n'agha lata n'anya-unu, ka Jehova siri.