Jona

1 2 3 4


Isi 2

Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere.
2 O we si, Esirim n'ahuhum kpọkue Jehova, O we zam; N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue Ya, I nuru olum.
3 N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile, Osimiri dikwam buruburu; Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim.
4 Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua; Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di.
5 Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi; Ob͕u-miri dim buruburu; Achara-miri kukurum n'isi.
6 Rue ala ugwu nile ka m'ridara; Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi: Ma I mewo ka ndum si n'olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem.
7 Mb͕e nkpuru-obim nēnweghi ike nimem, Jehova ka m'chetara: Ekperem we bakute Gi, ba n'ulo uku Gi di nsọ.
8 Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama, Ebere-ha ka ha nārapu.
9 Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi. Nzọputa diri Jehova.
10 Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n'ala-akọrọ.