Joel

1 2 3


Isi 3

N'ihi na, le, na mb͕e ahu na n'oge ahu, mb͕e M'gēme ka ndi Juda na Jerusalem adọtara n'agha lata,
2 M'gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n'etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère.
3 Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n'ihi manya-vine, ka ha we ṅua.
4 Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.
5 Ebe ọ bu ọla-ọcham na ọla-edom ka unu wereworo, ebe ọ bu kwa ezi ihem nile anāchọsi ike ka unu chibàworo n'ulo uku nile unu;
6 ebe ọ bu kwa umu Juda na umu Jerusalem ka unu nēre nye umu ndi Jevan, ka unu we me ka ha si n'ókè-ala-ha je n'ebe di anya:
7 le, M'gaje isi n'ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n'isi-unu;
8 M'gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n'aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n'ihi na Jehova ekwuwo.
9 Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.
10 Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m'bu.
11 Menu ngwa, bia, unu mba nile ndi bi buruburu, chikọtanu onwe-unu: Jehova, me ka ndi-dike-Gi rida n'ebe ahu.
12 Ka mba nile teta, rigota na ndagwurugwu Jehoshafat: n'ihi na n'ebe ahu ka M'gānọdu ikpe mba nile bi buruburu ikpe.
13 Tiye mma-iwe-ihe-ubi, n'ihi na ihe agēwe n'ubi achawo: bianu, zọcha; n'ihi na ebe-nzọcha-nkpuru-vine ejuwo, ebe-inara-manya-vine nile erubigawo; n'ihi na ihe ọjọ ha bara uba.
14 Ọtutu ìgwè madu, ọtutu ìgwè madu nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe! n'ihi na ubọchi Jehova di nso nime ndagwurugwu nkpebì-ikpe.
15 Anyanwu na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achikọpuwo kwa onwunwu-ha.
16 Jehova gēsi kwa na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; elu-igwe na uwa gēme kwa nkpatu: ma Jehova gāburu ndi-Ya ebe-nb͕abà, Ọ gābu-kwa-ra umu Israel ebe siri ike.
17 Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ.
18 Ọ gēru kwa n'ubochi ahu, na ugwu nile ganābusa manya-vine utọ, miri-ara ganērù kwa n'ugwu ntà nile, miri ganērù kwa n'ebe nile nke Juda miri si erù; isi-iyi gēsi kwa n'ulo Jehova puta, de ndagwurugwu Shitim.
19 Ijipt gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, Edom gāghọ kwa ọzara, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi ihe-ike emere umu Juda, n'ihi na ha awusiwo ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ala-ha.
20 Ma Juda gābu ebe madu bi rue mb͕e ebighi-ebi, Jerusalem kwa rue ọb͕ọ na ọb͕ọ.
21 M'gāgu kwa ọbara-ha n'ihe ikpe nāmaghi, bú nke M'nāgughi ya n'ihe ikpe nāmagh: n'ihi na Jehova nēbi nime Zaion.